Elizabeth Ativie
ụdịekere | nwanyị |
---|---|
mba o sị | Naijiria |
aha enyere | Elizabeth |
ọrụ ọ na-arụ | Onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị, nurse |
onye otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị | All Progressives Congress |
Elizabeth Ativie bụ onye ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa nke na-eje ozi ugbu a dị ka osote ọnụ na-ekwuru ụlọ ome iwu nke Edo Steeti kemgbe ụbọchị nke 25 n'ọnwa Julaị afọ 2016. Ọ rụrụ ọrụ dị ka ọnụ na-ekwuru ụlọ ome iwu site n'ụbọchị nke 9 n'ọnwa Mee afọ 2016, ruo ụbọchị nke 24 n'ọnwa Julaị afọ 2016.
Mmalite ndu na mmuta
dezieElizabeth Ativie bụ nwaafọ Edo Steeti mana o toro n'ọtụtụ akụkụ ala Naịjirịa n'ihi ọnọdụ ọrụ nna ya bụ onye uwe ojii. O nwere nzere bachelọ na Health Education na nzere nast na Sociology and Anthropology . [1]
Ọrụ
dezieElizabeth rụrụ ọrụ dị ka ọkachamara nọọsụ na Edo State Civil Service ruo n'afọ 2006 mgbe ọ lara ezumike nká dị ka Daịrektọ. [1] Ọrụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị ya malitere n'afọ 1999. N'afọ 1999 ma n'afọ 2003, ọ zọrọ oche maka ụlọ ome iwu Edo Steeti mana ọ rịturu n'ọkwa ugboro abụọ ahụ maka otu n'ime ndị ga-azọ ọkwa ọchịchị n'otu ndọrọndọrọ ọchịchị ya. [2]
Elizabeth zọrọ ma merie oche na State House na ntuli aka izugbe nke afọ 2007. Ụlọ ikpe mechara kagbuo ntuli aka ahụ. Kosiladị, mkpebi ya kwụrụ ụgwọ n'afọ 2011, mgbe ọ meriri oche ịnọchite anya mpaghara Uhunmwode na State House. [2]
Mgbe e nwepuchara Victor Edodor n'ụbọchị nke 3 n'ọnwa Mee afọ 2016, [3] Elizabeth ghọọrọ nwanyị izizi bụ ọnụ na-ekwuru ụlọ ome iwu Edo Steeti na-esote n'iyi e duru ya n'ụbọchị nke 9 n'ọnwa Mee, afọ 2016. [4] [5] N'ụbọchị nke 25 n'ọnwa Julaị, ọ gbadara bụrụ osote ọnụ na-ekwuru ụlọ ome iwu mgbe Onye ndu ọtụtụ ndị,bụ Folly Ogedengbe kpalitere mkpesa, onye kpọpụtara "matters of urgent public importance, for a change in the leadership of the House". Onye nọchiri ya bụ Justin Okonoboh. [6]
Nrụtụaka
dezie- ↑ 1.0 1.1 Photos: Hon. Elizabeth Ativie, 1st Female Speaker Of Edo State House Of Assembly Sworn In..See Profile. NaijaGist (9 May 2016). Retrieved on 27 May 2016.
- ↑ 2.0 2.1 "Women are scared of the muddy water of politics – Hon.Elizabeth Ativie", 8 April 2012. Retrieved on 27 May 2016.
- ↑ "Edo Assembly Speaker,Deputy Impeached", Channels Television, 3 May 2016. Retrieved on 27 May 2016.
- ↑ "Edo House Of Assembly Speaker Sworn-In", Channels Television, 9 May 2016. Retrieved on 27 May 2016.
- ↑ "Edo State Assembly swears in Mrs. Elizabeth Ativie, As new Speaker", DailyMedia Nigeria, 9 May 2016. Retrieved on 27 May 2016.
- ↑ "Edo Speaker, Elizabeth Ativie steps down for deputy", Vanguard, 25 July 2016. Retrieved on 31 August 2016.