Elifuraha Marealle
Elifuraha Ndesamburo Urio Marealle (Nwụrụ n'abalị iri na isii n'ọnwa Ọktoba n'afọ 2015) bụ onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Tanganyikan. N'afọ 1955, ọ bụ otu n'ime ụmụ nwanyị atọ mbụ a họpụtara na Kansụl Iwu.
Marealle gara Ashira Girls School na Moshi, ma mesịa kụzie n'ụlọ akwụkwọ ahụ.[1][2] N'ụbọchị Septemba 1948 ọ lụrụ Thomas Marealle, onye isi nke ndị Chaga.[3]
N'afọ 1955, a họpụtara ya na Kansụl Iwu dị ka otu n'ime ụmụ nwanyị atọ mbụ, naanị onye Afrịka n'ime atọ ahụ.[4][5] N'otu afọ ahụ, ọ bụ onye nnọchiteanya na nzukọ Marangu nke Chọọchị Lutheran dị ka onye nnọchi anya Chọọchị Evangelical Lutheran nke Tanganyika, ebe ọ bụ onye isi okwu.[6] Ọ ghọrọ onye otu YWCA n'afọ 1960s ma rụọ ọrụ na TANESCO.[2]
Ebenside
dezie- ↑ Marja-Liisa Swantz (2002) Beyond the Forestline: The Life and Letters of Bengt Sundkler, p140
- ↑ 2.0 2.1 Tanzania: First Tanzanian Woman LEGCO Member Dies Tanzania Daily News, 19 October 2015
- ↑ Miaka 100 ya chifu Marealla Habari Leo, 14 February 2015
- ↑ Councillors All Sydney Morning Herald, 12 May 1955
- ↑ Tanganyika Gets 1st Negro Woman Legislator Jet, 26 May 1955
- ↑ Journeying Together Lutheran Communion in Africa