En-Naddāha (Egyptian Arabic: النداهة "onye ọkpọ oku") bụ akụkọ ifo ndị Ijipt nke mmụọ nwanyị yiri naiad nke na-akpọ ụmụ nwoke na Naịl, ebe ha were ike ịnwụ maọbụ milaa. A maara ya nke ọma n'ime ime obodo Ijipt, ma n'ime ala na elu Ijipti, n'ogologo Osimiri Naịl na ọwa mmiri Naịl mpaghara ọrụ ugbo nke Ijipta.

Akụkọ ihe mere eme dezie

A maghị mmalite nakwa kpọmkwem ebe n'Ijipt ebe akụkọ ahụ malitere. Akụkọ ahụ na-ewu ewu na narị afọ nke 20 mgbe Ijipt bụ obere obodo karịa ka ọ dị ugbu a, ndị mmadụ ga-etinye nnukwu oge iji nọrọ nso na ọwa Naịl na mmiri Nail. Ụmụaka na-egwuri egwu n'akụkụ osimiri ya mgbe ụlọ akwụkwọ hapụrụ ha, ụmụ okorobịa ga na-ekwurịta okwu n'ebe ahụ nʼabalị. Ọ ghọwo ihe na-adịchaghị ewu ewu n'obodo ukwu ugbu a, ọ bụ ezie na ndị ntorobịa ka ma maka ya, a ka na'ahụkwa ya n"ime ime obodo Ijipt.

Edemsibịa dezie