Egwuregwu Ụwa nke Ụmụ nwanyị nke 1922

 

Marie Mejzlíková nke Abụọ
Mary Lines
Lucie Bréard
Camille Sabie
Hilda Hatt
Francesca Pianzola
Lucile Godbold

Egwuregwu ụwa nke ụmụ nwanyị afọ 1922 (French Jeux Olympiques Féminin, nakwa "Egwuregwu Olimpik nke Ụmụ nwanyị") bụ egwuregwu mba ụwa nke mbụ mgbe niile na asọmpi Track na ubi mbụ maka ụmụ nwanyị. Emere asọmpi a n'otu ụbọchị na ọnwa Ọgọst iri abuo, afọ 1922. [1] [2] na Pershing Stadium na Paris .

Ihe omume

dezie

Egwuregwu ndị ahụ bụ nke Fédération Sportive Féminine Internationale haziri n'okpuru Alice Milliat[1][2] dịka nzaghachi maka ịjụ nke Olimpik Kọmitii mba uwa itinye ihe omume ụmụ nwanyị na Egwuregwu Olimpik nke afọ 1924.

Ndị iri asaa na asaa sonyere egwuregwu a sitere na mba ise [2] Czechoslovakia, France (ndị egwuregwu iri atọ na abụọ), Great Britain, Switzerland na USA (ndị egwuregwu iri na atọ). Ndị otu America bụ: Kathryn Agar, Florieda Batson, Maybelle Gilliland, Lucile Godbold, Esther Green, Anne Harwick, Frances Mead, Maud Rosenbaum, Camille Sabie, Janet Snow, Elizabeth Stine, Louise Voorhees na Nancy Voorhees . [3]

Ndị na-eme egwuregwu ahụ sonyere n'ihe omume iri na otu: [2] na-agba ọsọ (100 mita, 100 yad, 300 mita, 1000 mita, 4 x 110 yad relay na mgbochi 100 yad), elu elu, ogologo ịwụli elu, iguzo ogologo ịwụli elu, nke ana kpo javelin ya na ịgba tinye.[4]

E ji Ememe egwuregwu Olimpik meghee asọmpi ahụ. Egwuregwu ahụ dọtara ndị na-ekiri 20,000 [1] na ndekọ ụwa 18 ka e debere.

Nchịkọta nrite

dezie
  1. 1.0 1.1 1.2 Kidd (1994). "The Women's Olympic Games: Important Breakthrough Obscured By Time". CAAWS Action Bulletin. Retrieved on 10 December 2013.  Kpọpụta njehie: Invalid <ref> tag; name "A" defined multiple times with different content
  2. 2.0 2.1 2.2 2.3 Laurence Prudhomme-Poncet, "Histoire du football féminin au XXe siècle" L'Harmattan 2003, page 99, Retrieved 10 December 2013
  3. Kpọpụta njehie: Invalid <ref> tag; no text was provided for refs named D
  4. FSFI Women's World Games GBR Athletics, Retrieved 10 December 2013