Egwu ikodoro

Ikorodo bụ egwu ndị Ezike Ọbá Nsụka di kwa n’ Enugwu Steeti.
Egwu ikorodo
type of dance
obere ụdị nkefolk dance Dezie
ndị ji ya eme iheNdị Igbo Dezie

Ikorodo[1]bụ egwu ndị Ezike Ọbá Nsụka di kwa n’ Enugwu Steeti. Egwu a bidoro site na ụmụagbọghọbịa na-amarọ nwoke. Ha na-eme ya kwa n’ ọnwa kwa n’ọnwa. Ọnwa ọbụna pụta, abịa n’ama Obodo nwere ya na eme ihe egwuregwu, eme ngara. Ụmụ ikorobịa topụtara etoputa ga anọkwa n’ akụkụ na-ekirikwe ha, ndị ihe ụmụagbọghọbia na-eme na amasi. Ụmụagbọghọbịa ejikwere egwu a na-emerụ ụmụnwoke a ngara, egosi kwa ha na ha etonugokwa ogo ịga na be dị. Eji egwu a egosi ụmụagbọghọbia chara acha na nwanyị, toruo ogo ma bụrụ ndi nne ha mụsiri ike. Ngwá egwú ana eji ágbá egwu a bu nke ana-akpo 'Ogene'. Ogene a bụ igwe. Ndị na-akpu ụzụ bụ ihe na-emepụta ya. Nwekwe nke ana-akpọ 'udu'. Ụdu a na adị ka ite. Ite ahụ, ana-eme ya ọmaa ezigbo mma, nwekwaa aka eji ebu ya, nwekwa ihe ana-akpọ foam. Ndị bekee kpọrọ ya foam. Ya  ka eji asụ ya bụ udu ga-eme ya ka ọ na adapụta ụda.

Egwu Ikorodo

E nwe kwara nke ana akpọ opi. Opi bụ ụmụ ịkorobịa na-eme ya, na-egosi na ihe ana-eme dị ha mma, bụ ndi ga a bịa nara opi a, na-eme ka egwu na-akwanite. E nweere nke ana akpọ ịgba. Ịgba bụ osisi ka eji arụpụta ya, ị baa n’ọhịa ịmara osisi na ama agba ntu, igbute ya, emezie ya nke ọma, were akpụkpọ anụ kwakọnọta ya ka onwe ike ina arụ ọrụ nke ọma. Enwekwara nke a na akpọ ịchaka. Ịchaka a bụ nke a ana-akpa akpaa. Akpacha ya, o nwere ihe a na-akwanye n’ime ya. O nwere ndị na-eji mkpụrụ ube awụnye n’ime ya, nwee ndị na-eji okpuchi bottle awụnye n’ime ya bụ Ịchaka. Ịchaka a i na- ayọ ya , ọ na-eme mkpọtụ dị egwu na-ebilitakwa ya bụ egwu.[2] [3]

Mkpọpụta dezie




Vidio dezie







Ebensidee dezie

  1. https://commons.wikimedia.org/wiki/File:Ikorodo_dance.ogg
  2. A. I. D. Project (2023-02- 04). English: Ikorodo is an igbo cultural dance indigenous to Ezike Orba, Enugwu ezike, Nsukka LGA, Enugu State. This is a maiden dance performed on a monthly basis in the native community. This audiovisual was recorded in Enugu State on 9 September 2022. The video features a dance performance from the Adanta cultural troupe and a story from Nnedu Linda Chinecherem in Enugu State. The video was directed and produced for the Audiovisuals of Igbo Dances Project (AID) by Tunde Oladimeji, a notable documentary film maker in Nigeria.. Retrieved on 2023-03-11.
  3. A.I.D project (2023-2-4). Audiovisual Igbo Dance. Retrieved on 2023-03-11.