Egwu Ode

egwu ọdịnala nke agbụrụ Igbo na Naijiria
Egwu Ode
type of dance
obere ụdị nkeite egwu Dezie
ndị ji ya eme iheNdị Igbo Dezie

Egwu Ode bu nke ndị Ọkpọsị dị n’ Afikpo Local Government, Ebonyi Steeti. Ode bụ egwu agha nke éjị wee jee agha wee turu ugo wee lọta. Akuko bu na ndi nwe egwu a na ndị agbata obi ha bụ ndị ofe mmiri na-azo ebe a na-akọ ihe ubi maka na anyị ha bụ ndị Ọkpọsị na-akọsi ubi ike. E wee bịa ịzọ ha ala, ebe ha na-akọ ihe ubi. O wée si otú a wee bido ọgụ. Ha wee lụwa ọgụ wee nweta mmeri na ya bụ ọgụ wee nata, wee wéré egwu a wee nye onwe ha obi añụri.

Egwu Ode

Enweghi mgbe ma ọ bụ ọnwa puru iche eji agba ya kama e nweé onye chọrọ ka eme ya óbi añụrị agbala Ode. Égwu a bụ egwu ụmụ ikoro na ụmụ agbọghọ na-agba. Ụmụ ntakịrị anaghị agba ya maka na ọ bụ egwu éjị ume ágbá. Aha ngwá egwú ndi eji akụ Ode bụ Igba, Udu, Ekwe ma ọ bụ ọkpọkọrọ, ọsha, na opi[1]

Mkpọpụta dezie



Ngwa Egwu Ode dezie


Vidio dezie

Egwu Ode







Edensibia dezie

  1. A. I. D. Project (2023-02-04). Ode Dance by A.I.D Project. Retrieved on 2023-03-12.