Dehlia Umunna
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya1973 Dezie
Ebe ọmụmụLondon Dezie
Ọrụ ọ na-arụacademic Dezie

Dehlia Victoria Umunna bụ Klinikalụ Prọfesọ nke Iwu na osote daịrektọ nke Instituutu na-ahụ maka iwu mpụ (CJI) n'ụlọakwụkwọ iwu nke Harvard. [1] Prọfesọ Umunna bụ ọkachamara ama ama n’obodo na iwu mpụ, ịgbachitere ndị e boro ebubo mpụ na tiori, mkpochi ọtụtụ mmadụ, yana esemokwu agbụrụ.

Mbido ndụ dezie

A mụrụ Umunna na Lọndọn, Ịnglandị, na 1973 site na nna onye Naịjirịa na nne Siera Lionu, o toro na Naịjirịa. O nwere ụmụ nne nwoke abụọ.

Mmụta dezie

Umunna natara nzere bachalọ ya na Kọmunikeshọn site na Mahadum nke Steeti Kalifonia , dị na San Bernardino, n'afọ 1995. O nwetara nzere JD ya n'ụlọakwụkwọ iwu nke Mahadum George Washington n'afọ 1998, ebe e nyere ya onyinye J.B Shapiro maka Mmasị Ọha, yana nzere mastas na Nchịkọta Ọhaneze site n'ụlọakwụkwọ Harvard Kennedy n'afọ 2011. [2]

Ọrụ dezie

Mgbe Umunna gụsịrị akwụkwọ n'ụlọ akwụkwọ iwu, Umunna sonyeere ndị ọrụ na-agbachitere ọha na eze nke distrikt nke Kolumbia, ebe ọ nọchitere anya ọtụtụ narị ndị na-eto eto na ndị okenye ihe na-esiri ike. N'afọ 2002, ọ Pụraktishọna Na Rezidensi na Mahadum America nke kọleeji nke iwu nke Washington, ebe ọ kuziri ma lekọta ụmụ akwụkwọ na Civil Clinic. Umunna sonyeere ndị ọrụ ụlọakwụkwọ iwu nke Harvard n'afọ 2007 dị ka onye nkuzi gbasara ahụike na Instituutu nke HLS na-ahụ maka iwu mpụ (CJI). A kwagoro ya n'ọkwa Osote daịrektọ nke CJI site n'aka-Diin Martha Minow n'afọ 2013. N'oge na-adịbeghị anya, a họpụtara Umunna dị ka Prọfesọ nke Clinical Law na HLS n'afọ 2015. [3] [4] [5] Ugbu a ọ na-enwe mmasi na nkụzi, ịdụ ọdụ, na ịdụ ụmụ akwụkwọ ọdụ, ebe ndị Klaasị nke afọ 2020 n'ụlọakwụkwọ iwu nke Harvard họpụtara ya iji nye okwu nke mbụ n'ime okwu anọ ya e depụtara n'usoro nke nkuzi "Last lectures" nke ụlọakwụkwọ iwu a. [6] Prọfesọ Umunna agbaala na ọtụtụ ụlọ mgbasaozi, gụnyere Criminal podcast, Black Enterprise, [7] na Special Report Network na Areva Martin. [8]

Edemede o biputagoro dezie

Edemede Umunna bu "Rethinking the Neighborhood Watch: How Lessons from Nigerian Villages Can Creatively Empower Communities to Assist Low-Income, Single Mothers In America," bụ nke e bitara n'oge na-adibeghị na American University Journal of Gender Social Policy and Law

Ebe m si dee dezie

  1. Staff. Criminal Justice Institute. Harvard Law School. Retrieved on 14 October 2020.
  2. Dehlia Umunna: Background. Harvard Law School. Archived from the original on 16 October 2020. Retrieved on 14 October 2020.
  3. Dehlia Umunna appointed Clinical Professor of Law at Harvard Law. Harvard Law School. Retrieved on 14 October 2020.
  4. Kiunguyu. "Meet Dehlia Umunna, the first Nigerian to be appointed as a professor at Harvard Law School", This Is Africa, 2 April 2019. Retrieved on 14 October 2020.
  5. Henry. "Dehlia Umunna appointed Clinical Professor of Law at Harvard Law", Westside Gazette, 28 March 2019. Retrieved on 14 October 2020.
  6. Milano. Last Lecture: "Every traumatic event is an opportunity to reset for greatness," says Dehlia Umunna. Harvard Law School. Retrieved on 14 October 2020.
  7. Givens (2020-05-13). Meet Harvard Law School's First Nigerian Professor (en-US). Black Enterprise. Retrieved on 2020-06-05.
  8. Areva Martin (en-US). Areva Martin (May 20, 2020). Retrieved on 2020-06-05.