Deborah Adetuni Egunyomi

Deborah Adetuni Egunyomi
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Aha enyereDeborah Dezie
aha ezinụlọ yaAdetunbi Dezie
Ọrụ ọ na-arụuniversity teacher Dezie
onye were ọrụMahadum nke Ibadan Dezie
ebe agụmakwụkwọKwara State College of Education, Mahadum nke Ibadan Dezie

Deborah Adetunbi Egunyomi (amụrụ ya na 10 Disemba 1953) bụ prọfesọ nke agụmakwụkwọ na-aga n'ihu na nke na-abụghị nke iwu kwadoro nke akpọrọ (Continuing and Non-formal Education) na asụsụ bekee na ụlọ Akwụkwọ Mahadum Ibadan, nke dị na Ibadan, Naịjirịa, ebe ọ jere ozi dị ka Onye isi nke Ngalaba Mmụta Ndị Ntorobịa nke akpọrọ Adult Education Department na asụsụ bekee.[1][2] Ọ bụ bu onye otu nleta nke gọọmentị nke Ekiti steeti guzobere iji kwudobe College of Health Science and Technology nke oma, Ijero-Ekiti .[3]

Ndụ mbido ya na kwazi Agụmakwụkwọ ya dezie

A mụrụ Egunyomi na obodo Ikole-Ekiti nke dị na Ekiti State, Nigeria, Nne na Nna ya bu David na Esther Famoroti. Ọ guru akwụkwọ praịmarị na Metọdist, Ikole-Ekiti, na afọ 1959-1964, o were jee Saint Mary's Girls Grammar School maka agụmakmakwụkwọ sekọndrị ya n'etiti afo 1964 na 1970, na Kwara State College of Education, Ilorin, site na 1974 ruo 1977. O mechara gaa Mahadum Ibadan maka B.Sc.Ed ya n'etiti 1980 na 1983, tupu ọ nweta M.Ed na Atụmatụ Mmụta na 1984 na Ph.D. na 1986.[4]

Ebe ndị ọrụ ru orụ dezie

N'afọ 1986, Egunyomi malitere ije ọrụ nkụzi ya na Mahadum Ibadan dị ka onye nkụzi enyemaka. O sonyere na ọmụmụ ihe maka nguzobe nke ihe ọmụmụ nke Mpuga akpọrọ External Studies Programme na bekee, nke a na akpọ Distance Learning Centre ugbua na Mahadum Ibadan.

E mere ya onye nkuzi na afọ 1992, onye nkuzi ukwu na afọ 1995, na kwa zi prọfesọ na afọ 2009. Ọ bụ onye na-anọchite anya onye isi na Ngalaba Mmụta Ndị Ntorobịa akpọrọ Department of Adult Education na asụsụ bekee n'etiti Febụwarị 2010 na Jenụwarị 2012 ma mesịa họpụta ya ọzọ dị ka onye isi nke Ngalaba ahụ na 2014.[5] Dị ka nwanyị prọfesọ mbụ na Ngalaba Mmụta Ndị Ntorobịa, Egunyomi nyere nkuzi nke ise kwa afọ na Mahadum Ibadan na 2 Julaị 2015.[6]

Ndụ ezinụlọ ya dezie

Deboarh Egunyomi bu nwunye Adeyemi Egunyomi, onye bu Prọfesọ nke Botany la goru ezumike nká.[7]

Edensibia dezie

  1. PROFESSOR Deborah Egunyomi | fresh news and views (en-GB). Archived from the original on 2020-06-06. Retrieved on 2020-06-06.
  2. UI Adult Education Department first in Nigeria, Africa —VC » Education » Tribune Online (en-GB). Tribune Online (2016-08-10). Retrieved on 2020-06-06.
  3. EKSG Appoints Visitation Panel for College of Health Science and Technology, Ijero-Ekiti – Ekiti State Website (en-US). Retrieved on 2020-06-06.
  4. Egunyomi. Curriculum Vitae. University of Ibadan. Archived from the original on 2022-10-19. Retrieved on 2022-10-19.
  5. Prof Michael Omolewa Delivers Inspiring Lecture As Adult Education Dept, UI Turns 70 (en-US). Prompt News (2019-10-02). Retrieved on 2020-06-06.
  6. Egunyomi. Balancing Life Equation with Continuing Education. University of Ibadan.
  7. "University of Ibadan, Kenneth Dike Library". DOI:10.1163/_afco_asc_1439.