Daniel Attoumou Amicchia

Onye Ghana na-ese foto (1908-1994)
Daniel Attoumou Amicchia
mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
ụbọchị ọmụmụ ya1908 Dezie
Ụbọchị ọnwụ ya1994 Dezie

Daniel Attoumou Amicchia (1908-1994) bụ onye Ghana na-ese foto nke biri na Grand-Bassam, Côte d'Ivoire.[1][2][3][4]

Mbido ndụ na ọrụ

dezie

Amicchia malitere ihe gbasara foto na 1920s. O mechara biri na Grand-Bassam, Côte d'Ivoire na 1948 ebe ọ rụrụ ọrụ ruo 1970.[3] Na Grand-Bassam, ọ nọgidere na-akpọtụrụ ndị Ghana na-asụ Bekee na Côte d'Ivoire bụ ndị ọ na-ese foto nke ukwuu.[1] Ọ rụrụ ọrụ dị ka 'onye ahịa na-eme njem' ma mepụta foto nke ezinụlọ na azụmaahịa.[3] A maghị ọtụtụ ihe banyere ndụ na ọrụ Amicchia n'ihi na ọ nweghị akwụkwọ ndekọ nakwa n'ihi na ezinụlọ ya tụfuru ihe ndekọ ya mgbe ọ nwụsịrị.[3]

Otú ọ dị, onye otu Amicchia bụ Joseph Ernest Kouao, debere ma chekwaa ihe ndị fọdụrụ n'ihe ndekọ nke onye na-ese foto. Revue Noire gosipụtara foto Amicchia na 1991.[1] Mgbe nke ahụ gasịrị, foto ya pụtara n'ọtụtụ ihe ngosi na ọdịda anyanwụ[5]

Ọnwụ

dezie

Amicchia nwụrụ n'afọ 1994 n'ihi ọrịa kansa.[1]

Ebensidee

dezie
  1. 1.0 1.1 1.2 1.3 Daniel Amicchia – Photo | Revue Noire. www.revuenoire.com. Retrieved on 2022-04-08.
  2. Looking sharp in West Africa (en-US). Apollo Magazine (2021-08-21). Retrieved on 2022-04-08.
  3. 3.0 3.1 3.2 3.3 Rédaction (2021-08-05). The history of photography: rise, realities and pioneers. (en-US). ON ART MEDIA. Archived from the original on 2022-01-26. Retrieved on 2022-04-08.
  4. Daniel Attoumou Amicchia - artist, news & exhibitions - photography-now.com. photography-now.com. Retrieved on 2022-04-08.
  5. Paris Photo 2011 : Place of honour for Africa (en-US). The Eye of Photography Magazine (2011-11-08). Retrieved on 2022-04-08.