Christina McAnea
ụdịekere | nwanyị |
---|---|
aha enyere | Christina |
aha ezinụlọ ya | McAnea |
ụbọchị ọmụmụ ya | 1958 |
Ebe ọmụmụ | Glasgow |
ọrụ ọ na-arụ | trade unionist |
onye were ọrụ | National Health Service |
onye otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị | Labour Party |
Christina McAnea (amụrụ n'afọ 1958) bụ onye isi otu ọrụ na Scotland.[1] bu onye ndu otu ndi ahia nke Scotland. A họpụtara ya ka ọ bụrụ odeakwụkwọ ukwu nke Unison n'ọnọdụ nke Dave Prentis. Wee weghara ọkwa ahụ na 22 Jenụwarị 2021.[2][3]
Ndụ mmalite na agụmakwụkwọ
dezieA mụrụ Christina McAnea na 1958 na Glasgow wee tolite na mpaghara Drumchapel, ebe ọ gara St. Pius School (ugbu a ebe Drumchapel High School).[2] Ọ rụrụ ọrụ na Civil Service, National Health Service na retail, tupu ọ gaa na Mahadum Strathclyde iji mụọ Bekee na akụkọ ihe mere eme..[1][2]
Ọrụ ya
dezieOru mbido
dezieMgbe mahadum gasịrị, ọ rụrụ ọrụ na Glasgow City Council dị ka onye ọrụ ụlọ tupu ọ malite ịrụ ọrụ maka GMB, ebe ọ dụrụ ndị ọrụ ọdụ ka ha na-ekpe ikpe n'ihu ndị were ha n'ọrụ..[1][2]
Ịdị n'otu
dezieMcAnea rụrụ ọrụ na Unison kemgbe e guzobere ya na 1993. Ọ rụrụ ọrụ na mbụ na National and Local Government Officers' Association (NALGO), na mbụ dị ka onye isi ụmụ nwanyị, tupu e jikọta ya na Unison.[1] Ọ ghọrọ otu n'ime ndị odeakwụkwọ ukwu ise nke Unison na Mee 2018.
Onye odeakwụkwọ ukwu nke Unison(General Secretary of Unison)
dezieA họpụtara McAnea ka ọ nọchie Dave Prentis ka ọ bụrụ odeakwụkwọ ukwu nke Unison na 11 Jenụwarị 2021, mgbe ọ nwetasịrị 47.7% nke votu ndị otu. Prentis abụrụla odeakwụkwọ ukwu afọ iri abụọ. Ọ malitere ọrụ na Jenụwarị 22, 2021..
Ndụ onwe ya
dezieMcAnea luru di ma bikwara na ndịda London.[2] O nwere ụmụ abụọ ndị toro eto.[2] McAnea soro ma bụru kwa onye otu Labour Party. Na mbido afọ 1980, ọ bụ onye otu Communist Party of Great Britain (CPGB).[1][4]
Edensibia
dezie- ↑ 1.0 1.1 1.2 1.3 1.4 Philippa White, "Assistants' champion ready for pay battle", TES, 8 November 2002. Retrieved 11 January 2021
- ↑ 2.0 2.1 2.2 2.3 2.4 2.5 Christina McAnea elected to lead UNISON, the UK’s largest union | Press release | News (January 11, 2021).
- ↑ "Christina McAnea is the new general secretary of UNISON", UNISON, 11 January 2021. Retrieved 11 January 2021
- ↑ About Me. Vote Christina. Vote Christina. Archived from the original on 22 October 2020. Retrieved on 11 January 2021.