Christian Gottlob Gmelin (ụbọchị iri na abuo n'ọnwa Ọktoba n'afọ 1792 ruo ụbọchị iri na atọ n'ọnwa Mee afo 1860) bụ ónyé Germany na-emepụta kemịkal. A mụrụ ya na Tübingen, Germany, ọ bụkwa nwa nwa Johann Konrad Gmelin na nwa nwa Johann Georg Gmelin.

Ọrụ sayensị dezie

N'afọ 1818, Gmelin bụ otu n'ime ndị izizi hụrụ na nnu lithium na-enye ụcha uhie na-egbuke egbuke n'ọkụ.

N'afọ 1826, a na-eto Jean-Baptiste Guimet màkà ịmepụta usoro maka imepụta Ultramarine. Afọ abụọ ka e mesịrị, na 1828, Gmelin bipụtara usoro nke ya màkà imepụta ultramarine. Ebe ọ bụ na Gmelin bụ ónyé mbụ bipụtara usoro a, ọ natara nkwanye ùgwù màkà nchọpụta a. [1]'akwụkwọ ya, Gmelin kwuru na silica, alumina, na soda bụ isi ihe mejupụtara ultramarine na ụcha bara ọgaranya sitere na sulfur.

Ọnwụ dezie

Gmelin nwụrụ na Tübingen, Germany, ébé ọ nọrọ ndụ ya niile, n'ubochi iri na atọ n'ọnwa Mee, afọ 1860.

Ọrụ dezie

  • Einleitung na die Chemie . Mpịakọta 1 na 2. Laupp, Thüringen 1835-1837 Mbipụta dijitalụ site na Mahadum na Ọbá Akwụkwọ Steeti DüsseldorfỌbá akwụkwọ Mahadum na Steeti Düsseldorf

Edensibia dezie