Cellodextrins bụ glukosu polima(polysaccharides) nke ogologo dịgasị iche iche (motu glucose abụọ maọbụ karịa) nke sitere na cellulisis, mmebi nke cellulosu

Nhazi ndị ọzọ dezie

A na-ekewa cellodextrin site na ogo ya nke polymerizashon (DP) nke na-egosi ọnụogụgụ nke glukosu monomers ọ nwere. A na-ejikọta monomer glucose ọ bụla site na njikọ beta-1.4 glycosidik, A na-edepụta cellodextrins ndị ama ama n'okpuru ebe a:[1]

  • cellobiose (DP=2) (mgbe ụfọdụ anaghị etinye ya na nhazi cellodextrin)
  • cellotriose (DP=3)
  • cellotetraosis (DP=4)
  • cellopentaose (DP=5)
  • cellohexaose (DP=6)

Ọrụ dezie

A na-emepụta cellodextrins site na nkewa nke cellulose n'ime ọtụtụ nje anaerobic site na cellulosome (mgbakọta nke cellulolytic enzymes na mpụga nke mkpụrụ ndụ). Endoglucanase na-ebu ụzọ belata cellulose crystalline na mpaghara amorphous na exoglucanases na-ekewa nnukwu akụkụ ndị a na-adịghị agwakọta nke cellulose n'ime obere cellodextrins na-agwakọta agwakọta agbakọta nke mkpụrụ ndụ nwere ike iji.

Ọtụtụ nje bacteria cellulolytic na-eji cellodextrins dị ka isi iyi ha nke ike. A na-enweta ike site na phosphorolytic cleavage nke njikọ glycosidic yana anaerobic glycolysis nke glucose monomers.[2] Mbufe nke cellodextrins gafee membrane nke mkpụrụ ndụ na-abụkarị usoro na-arụ ọrụ, na-achọ ATP.

Soro hukwa dezie

  • Dextrin na-agbaji starch

Edensibia dezie

  1. Cellodextrin Glycoproducts for life sciences - Engineering and production. www.elicityl-oligotech.com.
  2. Zhu (August 1, 2010). "Cellulose and cellodextrin utilization by the cellulolytic bacterium Cytophaga hutchisonii". Bioresource Technology 101 (16): 6432–6437. DOI:10.1016/j.biortech.2010.03.041. PMID 20362433.