Caroma

Ụlọ ịsa ahụ nke Australia, ụlọ ọrụ idebe ihe ọcha na ụlọ ịsa mmiri

 

Caroma (Caroma Dorf) bụ onye mmebe mba Australia na onye nkesa ngwaahịa ụlọ ịsa ahụ. Onye guzobere Caroma n'afọ 1941 bụ Charles Rothauser, onye mbà Hungary, ebe ọ bụ na ọ mechiri ụlọ ọrụ ikpeazụ ya n'afọ 2017 ugbua na-enweta ngwaahịa niile site na ndị na-emepụta ihe na mba ọzọ.[1] Caroma bụ onye enyemaka nke GWA International Limited, ma webata usoro Ụlọ mposi abụọ mbụ n'ụwa. Ụlọ ọrụ ahụ na-ekesa onwe ya n'ime mba Australia na mba ofesi na-ere site na ndị nkesa ya dị ka Sustainable Solutions International na North America na Sanlamere na United Kingdom.

E guzobere ụlọ ọrụ ahụ n'afọ 1941 na ụlọ ọrụ mmepụta ihe na Norwood, mpaghara dị n'ime ọwụwa anyanwụ mba Adelaide. Ụlọ ọrụ ahụ kwupụtara ebum n'ụche ya imechi mmepụta na mba Australia na ubochị 8, Ọnwa Ọktoba n'afo 2014. Ụlọ ọrụ ahụ dị na Wetherill Park na mba Sydney mechiri n'afọ 2014.[2] O mechara mechie ụlọ ọrụ Norwood na ụbọchị 24, n'ọnwa Febụwarị, n'afọ 2017. A n'emepụta ihe ugbu a na mba Malaysia, China na Europe. [1]

  1. 1.0 1.1 Castello. "Bathroom manufacturer Caroma will close the doors of its Adelaide factory ending 76 years of manufacturing tradition", The Advertiser, 24 February 2017. Retrieved on 2 March 2018. Kpọpụta njehie: Invalid <ref> tag; name "closing" defined multiple times with different content
  2. Foster. "Caroma and Dorf owner GWA slashes 164 jobs as it shuts two factories", The Courier-Mail, 8 October 2014. Retrieved on 2 March 2018.