Caesar Carl Hans Henkel

Onye nka South Africa (1839-1913
Caesar Carl Hans Henkel
Mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
mba o sịSouth Africa Dezie
Aha enyereCaesar Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya1839 Dezie
Ụbọchị ọnwụ ya16 Jụn 1913 Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee Dezie
Ọrụ ọ na-arụcartographer, onye ese Dezie
ikike nwebiisinka dị ka onye okikecopyrights on works have expired Dezie

Caesar Carl Wilhelm Hans Henkel (1837 Fulda, Hesse - ubochí irí na isii n'ọnwa June 1913 Umtata), bụ ónyé Germany a mụrụ na South Africa na-ahụ màkà ọhịa, ónyé na-ese map, Ónyé na'ese ihe, onye agha na onye na-ahụ Màkà ihe ọkụkụ. Ọ bụ nna John Spurgeon Henkel.

Panoramic view of Umtata and the Drakensberg (1913)
by Caesar Henkel
Gathering of Buck by a Waterfall (1899)
by Caesar Henkel

Henkel si n'ezinụlọ ndị agha Germany ichié ma dị íchè íchè. Ọ debanyere aha dị ka ónyé isi na British-German Legion n'oge Agha Crimea. Agha ahụ kwụsịrị tupu ndị British-German Legion ahụ ihe ọ bụla, Henkel biri na Eastern Cape na 1856, ebe ọ rụrụ ọrụ dị ka odeakwụkwọ nke onye isi Baron Richard von Stutterheim (1809-1872) ma rụọ ọrụ dị mkpa n'ịkwado ndị Germany kwagara na mpaghara King William's Town.[1][2]

N'ịlaghachi n'ọrụ na Indian Mutiny, Henkel jupụtara n'ọkwa nchịkwa dị íchè ichè na Eastern Cape n'etiti 1860-75. O gosipụtara na ọ bụ ónyé na-ese map nke ọma n'ọfịs nke ónyé nyocha-ọchịchị n'etiti afọ 1876 rụọ 83; map ya nke Transkei weere mgbe ahụ dị ka ọrụ doro anya. Mgbè nke ahụ gasịrị, ọ rụrụ ọrụ dị ka onye na-elekọta ọhịa na mpaghara Stockenstrom na King William's Town. N'ikpeazụ, a họpụtara ya ka ọ bụrụ ónyé isi ọhịa ma debe ya na Umtata ma bụrụkwa ónyé na-ahụ màkà nchekwa nke oké ọhịa ndị a na-ahụkarị na mmepe nke ọhịa azụmahịa na Transkei. Ọrụ ọsụ ụzọ ya n'ọhịa ndị a nwere mmetụta dị ukwuu n'ụzọ a na-eme n'ọchịchị na South Africa. Henkel wepụtara iwu nke iguzobe ubi wattle dị íchè ichè na Transkei iji belata mmebi nke oké ọhịa ndị a.

Mgbè ọ lara ezumike nká, ọ ghọrọ ónyé kansụl ọbọdọ nkè Umtata wee malite ibubata osisi na obere osisi bara uru na nke a na-adịghị ahụkebe nke ọ kụrụ na ala ya, "The Pines", na mpụga Umtata. N'ebe a ka ọ bịdọrọ ebe mbụ a na-amụ azụ na mba ahụ. A na-echeta aha ya na Podocarpus henkelii . A na-edebe ụfọdụ n'ime ihe osise ya na East London Museum, Africana Museum na Johannesburg na History Museum na Grahamstown.

Onye nke ya dezie

Caesar Henkel lụrụ Auguste Radue (ubochí irí àtó n'ọnwa Nọvemba 1850 Arnswalde - ụbọchị isii n'ọnwa Ọktoba 1928) ha zụlitere ezinụlọ nke ụmụ nwoke isii na ụmụ nwanyị isii:

  • John Spurgeon Henkel (1871-1962) x Juanita NN xx Ethel Mary NN
  • Paul Louis Henkel
  • Maria Josephina Ida Henkel x Fritz Wilhelm Waldemar Borchers
  • Martha Charlotte Henkel
  • Philip Carl Henkel
  • Anna Henkel
  • Ida Pauline Henkel (nwụrụ mgbe ọ bụ nwa ọhụrụ)
  • Benjamin Henkel (1881-1947) x Winifred Maud Hawken (1886-1970)
  • James Henkel (1882-1964) x Rhoda NN (1888-1958)
  • Jemima Henkel
  • Charles Frederick Henkel (1886-1946)
  • Josephine August Henkel x Burton Alexander Nicol (1870-1937)

Akwụkwọ ndị e bipụtara dezie

Edensibia dezie

  1. Richard von Stutterheim. Archived from the original on 2007-08-06. Retrieved on 2008-10-20.
  2. History of Stutterheim. Archived from the original on 2009-11-08. Retrieved on 2008-10-20.