Céline Ratsiraka

Céline Marthe Ratsiraka bụ onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Madagascar, onye ndọrọ ndọrọ àmà àmá, na nwunye onye bụbu onye isi ala nwụrụ anwụ Didier Ratsiraka. Ratsiraka bụ nwanyị mbụ nke Madagascar nke nọkarịchara ogologo oge n'oche dika nwunye onye isi ala n'akụkọ mba ahụ, ebe ọ nọ n'ọkwa ahụ site n'afọ 1975 ruo afọ 1993 na site n'afọ 1997 ruo afọ 2002.[1] Ọ bụ onye nwere mmetụta dị ukwuu n'ime òtù ndọrọndọrọ ọchịchị Association for the Rebirth of Madagascar (AREMA) na-achị site n'afọ 1970s ruo 1990s, ọkachasị n'ime akụkụ aka ekpe nke òtù ndọrọndọrọ ahụ.[2][3]

Céline Ratsiraka
First Lady of Madagascar
[[ Ambassador to Àtụ:CountryPrefixThe]]
In role
Àtụ:En dash range
PresidentDidier Ratsiraka
Preceded bySahondra Ratsirahonana
Succeeded byLalao Ravalomanana
[[ Ambassador to Àtụ:CountryPrefixThe]]
In role
Àtụ:En dash range
PresidentDidier Ratsiraka
Preceded byThérèse Ratsimandrava
Succeeded byThérèse Zafy
Personal details
Born
Céline Marthe Velonjara

French Madagascar
Political partyAREMA
Spouse(s)
(m. 1964; died Àtụ:Hover title)
Children4

Akụkọ ndụ ya dezie

A mụrụ Ratsiraka dịka Céline Velonjara.[1] Ọ bụ nwa nwanyị nke Pascal Velonjara, onye omeiwu n'oge ọchịchị ndị France na onye guzobere Parti des déshérités de Madagascar (PADESM).[3]

N'afọ 1964, ọ lụrụ Didier Ratsiraka, onye ọrụ ụgbọ mmiri na-eto eto, n'emume ndị ụka Katọlik nke Ukọchukwu Armand Gaëtan Razafindratandra nọ n'isi ya [1] Di na nwunye ahụ nwere ụmụ anọ: ụmụ nwanyị atọ - Olga, Sophie, Annick - na otu nwa nwoke, Xavier.[1]

Didier Ratsiraka weekwara ọchịchị na 1975 dị ka onye isi oche nke Supreme Revolutionary Council. N'oge ọchịchị di ya site n'afọ 1975 ruo afọ 1993, Céline Ratsiraka ghọrọ onye àmà àmá, na ndọrọ ndọrọ ọchịchị Madagascar nakwa otu ndorondoro AREMA nke na-achị dị ka nwanyị mbụ na nwunye onye isi ala.[2] Céline Ratsiraka na nwanne ya nwanyị, Hortense Raveloson Mahasampo, bụ ndị ndú n'akụkụ aka ekpe nke otu AREMA, iji mee ka akụkụ aka ekpe na akụkụ aka nri nke nwekwara ndị àmà àmá dịka Pascal Rakotomavo na Rakotovao Razaka草 hara nhatanha.[2] Ratsiraka na nwanne ya nwanyị hazikwara ma duzie ngalaba ụmụ nwanyị nke òtù ndọrọndọrọ ahụ, nke a maara dị ka AREMA Women.[3] Tụkwasị na nke a, Céline Ratsiraka nọkwara n'isi n'òtù AREMA Cooperative Movement gụnyekwara ụlọ ọrụ itinye ego a na-akpọ PROCOOP.[3]

Didier na Céline Ratsiraka gbaara ga zoo na mba France n'ọnwa Julaị 2002, na-emechi nsogbu ndọrọ ndọrọ ọchịchị ọnwa asaa na-esote ntuli aka onye isi ala nke afọ 2001 n'etiti Ratsiraka na onye meriri n'eziokwu bụMarc Ravalomanana.[4][5]

N'ọnwa Eprel afọ 2013, ezinụlọ Ratsiraka laghachiri Madagascar ka ha gbachara ọsọ ga zoo na mba France ruo afọ iri na otu, ka di ya wee nwee ike ịzọ ọkwa onye isi ala nke afọ 2013.[6] Ụlọ ikpe ntuli aka wepụrụ Ratsiraka na ndọrọndọrọ ahụ n'ọnwa Ọgọstụ afọ 2013 maka na ọ dara iwu ibi n'ala ahụ opekata mpe ọnwa isii tupu ntuli aka eruo.

N'abalị iri abụọ na abụọ n'ọnwa Maachị n'afọ 2021, a nabatara Céline Ratsiraka na di ya n'ụlọ ọgwụ ndị agha Soavinandriana (CENHOSOA) dị na Antananarivo, maka ọgwụgwọ nke "obere ahụ ọkụ", dị ka ndị ikwu ha si kwuo.[7][8] Didier Ratsiraka nwụrụ n'ụlọ ọgwụ site n'ọría nkuchị obi ka ụbọchị ole na ole gasịrị na abalị iri abụọ na asatọ nke ọnwa Machị afọ 2021, ka ọ gbachara afọ iri asatọ na anọ.[8]

Ihe odide dezie