Bridget Otoo
ụdịekere | nwanyị |
---|---|
mba o sị | Ghana |
ụbọchị ọmụmụ ya | 1980s |
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | Bekee |
ọrụ ọ na-arụ | onye ntaakụkọ |
ebe agụmakwụkwọ | University of Media, Arts and Communication, University of Ghana, Bompeh Senior High Technical School |
Bridget Otoo (nke onye amụrụ n'abalị iri atọ na otu nke ọnwa Disemba n'afọ 1983) bụ onye nta akụkọ Ghana, onye mgbasa ozi na onye ọrụ mmekọrịta ọha na eze.[1][2] O jere ozi na ọkwa dị iche iche na TV3 Network Limited dị ka onye mgbasa ozi na onye na-ahụ maka akụkọ.[2][1][3] Ọ bụkwa onye na-akwado ikike ụmụ nwanyị yana obodo LGBTQI + na Ghana.[4]
Agụmakwụkwọ
dezieOtoo gụrụ akwụkwọ praịmarị na Aggrey Memorial Basic School, Sekondi tupu ọ gawa Bompeh Senior High Technical School, Takoradi, maka agụmakwụkwọ ụlọ akwụkwọ sekọndrị ya, ebe ọ bụ onye enyere ọkwa onyeisi ụmụ akwụkwọ umunwanyi.[5] A na-akpọ ya aha njirimara “The “Headmistress”” e nyere ya aha a n’ihi àgwà ọ na egosiputa dị ka ntukwasi obi,nga n' ihu na adịghị oké nkọ.[6]
O nwetara nzere ya bụ Bachelor of Arts (BA) na Mass Communication Studies n'ulo akwụkwọ ndị nta akụkọ Ghana bụ Ghana Institute of Journalism (GIJ). O nwekwara nzere Master of Business Administration (MBA) na Mahadum nke Ghana, Legon .[7]
Ọrụ
dezieOtoo rụrụ ọrụ na Ghana Ports and Harbours Authority (GPHA) ọrụrụ ọrụ mmekọrịta ọha na eze n'oge ọrụ mba ya. Ọ rụrụ ọrụ na mgbasa ozi na redio na TV na Good News FM na Sky TV n'afọ 2008. Tupu nke ahụ n'afọ 2003, ọ bụ onye nso n'olu na-edekọ mgbasa ozi nye ụfọdụ ụlọ ọrụ (Tigo, Barclays, Unilever na Ecobank). Ọ kwadoro "New Day", "You and the Police" na akụkọ oge na TV3 ruo oge ụfọdụ.[7][8][5]
Ndụ onwe onye
dezieBridget, nwa Francis Otoo na Agnes Arthur, nwere ụmụnne isii (6).[7] N'afọ 2021, O kwupụtara nguzo ya banyere LGBTQ wetara ọtụtụ esemokwu O kwusiri ike na ndetu Twitter na-ekwu na ọ dị njikere ma na-enweghị ọdịmma onwe ya ịkwado usoro LGBTQI na Ghana n'agbanyeghị ihe ndị okpukpe na-ekwu banyere ha.[4] O kwuputakwara na ọ bụrụ na ịkwado LGBTQI bụ ụzọ kachasị ngwa ngwa ma dị mfe ime mmadụ aga ọkụ mmuọ, ọ dị njikere maka nkwado n'ihi na ọ chọrọ izute ekwensu.[4]
Edensibia
dezie- ↑ 1.0 1.1 Can Ghana media do better? [Article] (en-US). Citi 97.3 FM - Relevant Radio. Always (2017-04-18). Retrieved on 2020-10-13.
- ↑ 2.0 2.1 Bridget Otoo, Manasseh Awuni Azure, Anas Aremeyaw Anas among most abused journalists – iWatch Africa (en-US). Citinewsroom - Comprehensive News in Ghana (2020-04-24). Retrieved on 2020-10-13.
- ↑ Own up and apologise - Bridget Otoo ‘punches’ TV3 over 2020 elections gaffe (WATCH) (en-US). Pulse Ghana (2020-12-17). Retrieved on 2021-01-05.
- ↑ 4.0 4.1 4.2 Blogger. Bridget Otoo Endorses LGBTQI+; Says She Never Minds Going To Hell - FillaBase.Com (en-US). Retrieved on 2021-03-06.
- ↑ 5.0 5.1 Five things you didn’t know about TV3’s Bridget Otoo (en). www.ghanaweb.com (2016-05-07). Retrieved on 2020-10-13.
- ↑ 10 Interesting Facts About Bridget Otoo That You Didn't Know (en-US). GhanaCelebrities.Com (2019-10-17). Retrieved on 2021-03-06.
- ↑ 7.0 7.1 7.2 Bridget Otoo - Helping to bridge gap between you and Police (en-gb). Graphic Online. Retrieved on 2020-10-13.
- ↑ Do you want to trend or you don't have sense? – TV3’s Bridget Otoo attacked on Twitter (en). www.ghanaweb.com (2019-10-14). Retrieved on 2020-10-13.