Bobby Holcomb

Onye Hawaii na-eme nkà (1947-1991)
Bobby Holcomb
Mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
mba o sịNjikota Obodo Amerika Dezie
Aha ọmụmụRobert Holcomb Jr. Dezie
Aha enyereRobert Dezie
aha ezinụlọ yaHolcomb Dezie
aha pseudonymBobby Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya25 Septemba 1947 Dezie
Ebe ọmụmụHonolulu Dezie
Ụbọchị ọnwụ ya15 Febụwarị 1991 Dezie
Ebe ọ nwụrụHuahine Dezie
Ụdị ọnwụeke na-akpata Dezie
ihe kpatara ọnwụọrịa kansa Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaFrench language, Tahitian, Bekee Dezie
Ọrụ ọ na-arụonye na-ede ihe, onye na-abụ abụ, onye ese, Ọgba egwu Dezie
ụcha ntụtụ isiauburn hair Dezie
Ọnọdụ ahụikeọrịa kansa Dezie
ngwa egwuukulele, olu egwụ Dezie
webụsaịtịhttp://www.bobbyholcomb.net/ Dezie
ikike nwebiisinka dị ka onye okikeỌrụ nwebiisinka chekwara Dezie

Bobby Holcomb (1947-1991) bụ ónyé na-ese ihe na ónyé na-eti egwu nke dere egwu Polynesia a ma ama.

Ihe oyiyi nke Bobby Holcomb nke onye na-ese ihe Evrard Chaussoy

Akụkọ ndụ dezie

A mụrụ Bobby Holcomb na 1947 na Honolulu, Hawaii, nwá nwoke nke nnà African-American si Georgia, na nné Hawaiian-Portuguese.

Na mbido afọ 1970, ọ gàrà ọtụtụ ebe n'Eshia, Europe na Amerịka. Na France, ya na ndị otu egwu French dị ka Zig Zag Community na Johane of Arch, ya na onye na-ese ihe na France Sylvain Duplant, Jean-Pierre Auffredo na Éric Estève rụkọkwara ọrụ. Ọ kwagara Tahiti na 1976, wee bírí n'àgwàetiti Huahine ma mụta asụsụ Tahitian.[1] Ọ malitere ide egwu n'asụsụ Polynesian, ma jikọta abụ ọdịnala Polynesian na reggae na egwu a ma ama. A maara ya n'etiti ndị na-ege ntị dị ka "Bobby". Edere ọtụtụ n'ime abụ ya na Polynesian, mana o jikwa French na Bekee mee ihe màkà ụfọdụ okwu. Abụ ya kachasị ewu ewu na Tahiti bụ "Orio", nke e mepụtara n'afọ 1985.

Na mgbakwunye na egwu, ọ bụkwa ónyé na-ese ihe ma na-ese ọtụtụ murals na ihe osise.[2] O jiri nka ya kwalite ọdịbendị Tahiti, ma mee mkpesa megide ọchịchị ndị France na nnwale nuklia na agwaetiti ahụ.[3] Màkà mbọ agụmakwụkwọ na ọdịbendị ya, a kpọrọ ya Ónyé nke Afọ nke French Polynesia na 1988.[2]

Ọ nwụrụ n'ọrịa kansa na ubochí irí na isé n'ọnwa Febụwarị, 1991. Ụlọ ọrụ telivishọn dị n'ógbè Tahiti weere ọnwụ ya dị ka ihe dị oke Mkpà nke mba.

Njikọ ya na Jimmy Buffett na Pascal Nabet Meyer dezie

Otu n'ime egwu ndị a ma ama nke Holcomb na United States bụ "One Particular Harbour", nke ya na ónyé America na-agụ egwu na-ede egwu bụ Jimmy Buffett dere na 1983. Egwú ahụ pụtara na album Buffett nke otu aha ahụ ma na-eme ya na ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ kọntaktị ya niile. N'afọ 1982, Holcomb zutere Pascal Nabet Meyer (Walter Becker, Rickie Lee Jones, Steely Dan, Daniel Lanois, David Lynch), ónyé kwagara Tahiti, ha abụọ jikọtara aka dee egwu. Nabet Meyer mepụtara ma dekọọ abọm mbụ ya nke Billboard, nke akpọrọ Rapa Iti, ya na The Tahitian Choir, na-eweta egwu Polynesian ọdịnala nye ndị na-ege ntị n'ụwa.

Ihe osise dezie

Akwụkwọ Varua Tupu (2006) nwèrè ọtụtụ ihe osise Holcomb.

Otu n'ime ihe osise kachasị ewu ewu nke Holcomb bụ "The Kites of Mata'Irea" nke na-egosi ndị Polynesia na-efe efe.

Nkọwapụta dezie

Holcomb etinyeghị aka na nnukwu akara, a na-emepụta egwu mbụ ya na cassettes. Abọm ndị mere ụzọ ha gaa na diski compact adịghịzi ebipụta, na mbipụta eji eme ihe dị nnọọ ụkọ. Telivishọn Tahiti mere ụfọdụ vidiyo nke Holcomb na-eme egwu ya na 1980s, ụfọdụ n'ime vidiyo ndị ahụ nwèrè ike ịchọta na ịntanetị, na saịtị dịka YouTube.

Ụtụ mgbe ọ nwụsịrị dezie

N'afọ 2021, ónyé na-ese ihe na Polynesia bụ Evrard Chaussoy na nkwado nke enyi ya Heiarii Girard, mepụtara ihe oyiyi ọla nchara nke Bobby dị mita atọ na iri ise.[4]

Edensibia dezie

  1. Dillane (30 September 2018). Songs of Social Protest: International Perspectives (in en). Rowman & Littlefield, 145. ISBN 978-1-78660-127-8. 
  2. 2.0 2.1 Sullivan. Across the Reef. Hana Hou!. Archived from the original on 14 November 2021. Retrieved on 14 November 2021.
  3. Stratton (17 July 2020). Multiculturalism, Whiteness and Otherness in Australia (in en). Springer Nature, 150. ISBN 978-3-030-50079-5. Retrieved on 14 November 2021. 
  4. La dépêche de Tahiti - 2021 - Une statue à l'occasion du 30e anniversaire de la mort de Bobby. Archived from the original on 2022-05-30. Retrieved on 2022-06-27.

Njikọ mpụga dezie