Bilkisu Funtuwa
ụdịekere | nwanyị |
---|---|
mba o sị | Naijiria |
ụbọchị ọmụmụ ya | 1960 |
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | Asụsụ Hausa, pidgin Naịjirịa |
Asụsụ ọ na-ede | Asụsụ Hausa |
ọrụ ọ na-arụ | ode akwukwo ifo, odee akwụkwọ |
Ebe obibi | Funtua |
okpukpere chi/echiche ụwa | Okpukpere Alakụba |
nnọchiaha nkeonwe | L484 |
Hajiya Bilkisu Salisu Ahmed Funtuwa Audio bụ onye ode akwụkwọ Naijiria . Ọ na-ede akwụkwọ ọgụgụ na Awụsa na-elekwasị anya n'ụmụ nwanyị Alakuba bụ ndị isi . [1] Ọ bu otu n’ime ndi a mara akuko banyere akwukwo ha ama dika “Kano market literature” ma obu Littattafan Soyayya - “books of love”.
Akwụkwọ akụkọ ya jikọtara isiokwu nke ị kwalite ụmụ nwanyị na i nye nwanyị oke ha nke metụtara ndị Awụsa na Alakụba, nke sitere na ahụmịhe nke ya dịka onye otu ndị otu a. [2] Bilkisu Funtuwa na-akwusi ike n'ọrụ a na-atụ anya n’aka ya na omume okpukpe nke ịlụ karịa otu nwanyị bụ nke bụ ndụ nke ụmụ nwanyị Awụsa, na-edekwazị banyere etu a ga-esi luso ọnọdụ ndị a agha. Ọrụ Funtuwa na-elekwasị anya na ndị isi nwanyị na-eji agụmakwụkwọ ha yana ofufe okpukpe ha bulie onwe ha elu nke ọma. Ndị a na-arụ ọrụ nke ndị ọka ikpe, ndị dọkịta, na ndị ọrụ gọọmentị ma na-ebikwazị ndụ dịka ndị ọchụnta ego bara ọgaranya. Otu n'ime isiokwu akọwapụtara nke ọma n'ọrụ ya bụ ịhụnanya miri emi. N'ime ọrụ ya, di na nwunye na-emekọrịta mmekọrịta juputara na nkwanye ugwu, mmekọrịta chiri anya, na ihe ụtọ oge ha abụọ. [3] Na-ilekwasị anya na ụmụ nwanyị ị na-achịkwa ezinụlọ ha, akwụkwọ akụkọ ya na-agbakwa ụmụ nwanyị Alakuba ume ka ha lekwasị anya na agụmakwụkwọ ma na-ejigide okwukwe ha. [1]
Funtuwa na ezi na ụlọ ya bi na Funtua,na Katsina Steeti, na Naijiria .
Akwụkwondị o dere
dezie- 1994: 'Allura Cikin Ruwa ( Needle in a Haystack )
- 1996: Wa Ya San Gobe ( Who Knows Tomorrow Will Bring?)
- 1997:)
Ebem si dee
dezie- ↑ 1.0 1.1 Sheldon, Kathleen E. (2005). Historical Dictionary of Women in Sub-Saharan Africa. Scarecrow Press, 88. ISBN 0-8108-5331-0.
- ↑ Sheme, Ibrahim (7 April 2007). Bilkisu Funtuwa Interview. author. Bahaushe Mai Ban Haushi! blog. Retrieved on 30 July 2009.
- ↑ Whitsitt, Novian (April 2003).