Betty Irabor

Onye na-ede akwụkwọ akụkọ Naijiria, onye ọrụ ebere, onye edemede, onye mbipụta na onye guzobere magazin Genevieve
Betty Irabor
Mmádu, magazine
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Aha enyereBetty Dezie
aha ezinụlọ yaIrabor Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya25 Maachị 1957 Dezie
nwaSonia Irabor Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee Dezie
Ọrụ ọ na-arụOdee akwụkwọ, Onye ntaakụkọ Dezie
nnọchiaha nkeonweL484 Dezie

Betty Irabor bụ onye Naijiria na-ede akụkọ,onyena-enyere mmadụ aka, onye nhiwe na mbiputa nke Genevieve magazine. O nweburu otu kọlụm na akwụkwọ akụkọ Black & Beauty UK. O nwekwara ntọala na-akwalite ị mata maka ọrịa ara ure, ịchọpụta ya n'oge na ọgwụgwọ. [1] [2]

Betty Irabor, Onye guzobere na onye mbipụta, Genevieve Magazine

A mụrụ Irabor n'ụbọchị nke 25 n'ọnwa Maachị, n'afọ 1957.

Ọrụ dezie

Betty Irabor bụ otu n’ime ndị ode akwụkwọ bụ ọkaibe na ndị na-ebipụta akụkọ na Naijiria. Irabor mụrụ asụsụ Bekee na mahadum were tinyezie isi n'ibipụta akwụkwọ. Ọ rụrụ ọrụ dịka onye nta akụkọ na akwụkwọ akụkọ Concord, ọrụ ndị nwe onwe ha na Vanguard, The Guardian,Thisday na Black & Beauty magazine na UK na ndị ọzọ na mba ofesi. N'afọ 2005, onye ọchụnta akụkọ mgbasa ozi na onye edemede a malitere Genevieve Foundation nke na-eme Pink Ball kwa afọ dị ka ụzọ e ji enweta ego e ji enyere ndị na-arịa ọrịa kansa aka. [3]

O mechara banye na azụmaahịa nke ihe nkwukọrịta ma gbahapụ ihe niile iji bido Genevieve Magazine n'afọ 2003 nke enwere ike ị kọwa dị ka ihe gaziri nke ọma, ma bụrụkwa otu n'ime akwụkwọ akụkọ maka ndụ, ejiji na ịma mma a kachasị agụ na Naijiria. Irabor bụ onye isi nchịkọta na onye isi nchịkwa nke Genevieve magazine. Ọ bụkwa onye na-enyere ndị mmadụ aka, okwu okwu n'ihu ọha na onye ndu mmeri maka ị mata maka ọrịa ure ara ya na ndị ọrụ ebere ya a ma dịka Genevieve PinkBall Foundation. Tupu ị malite Genevieve Magazine n'afọ 2003, ọ rụburu ọrụ dịka onye ode akwụkwọ nwe onwe ya na akwụkwọ akụkọ ThisDay na Vanguard ma nyekwa akụkọ ole na ole maka akwụkwọ akụkọ Black & Beauty magazine UK [4] A makwaara ya dịka onye ngosi nke Life's Lessons with Betty Irabor. Ọ bụ ọkà okwu na onye nnọchi anya nke na-ekesa foto ị kwalite ma ị kwado ngosipụta uwe site na Instagram maka ndị na-eso ụzọ ya ruru 80,000 [bettyirabo] [5] Onye guzobere @mybeautifulmindnetwork. [6]

Ndụ onwe ya dezie

A mụrụ ya n'afọ 1957 ma zụlite ya na Naijiria. Ọ lụrụ Soni Irabor' Ha nwe ụmụaka abụọ. [7] O nwere nwa nwoke nke ndi Zanzibar International Film Festival hoputara obere ihe nkiri ya. Ọ i ge egwu Tina Tuner na Westlife. N’afọ 2018. Irabor na di ya mere emume ncheta agbamakwụkwọ ha nke iri atọ na ise. [8]

Onyinye na nsọpụrụ dezie

A kwanyeere ya ùgwù nke ndị Association of Professional Women Bankers dịka The Most Accomplished Female Publisher in Nigeria 2011[9]

Ebe m si dee dezie