Bernard Fonlon
Bernard Nsokika Fonlon (19 Nọvemba 1924 - 27 Ọgọst 1986) bụ onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Cameroon na onye nkuzi nke rụrụ ọrụ na mmepe nke asụsụ abụọ na Cameroon . [1]
Mbido ndụ na agụmakwụkwọ
dezieA mụrụ Bernard Fonlon na 19 November 1924 na Kumbo Nso na Cameroon. [2] Ọ malitere agụmakwụkwọ elementrị ya n'ụlọ akwụkwọ Katọlik ma mesịa gaa n'ihu Christ The King College Onitsha, Anambra n'afọ 1940. Ọ gara n'ihu na Bigard Memorial Seminary na Steeti Anambra, ebe ọ mụrụ Nkà Ihe Ọmụma na Nkà Mmụta Okpukpe. Mgbe ahụ, ọ gara Dublin maka Master's in Literature na Mahadum Ireland Dublin na 1954. O nwetara PhD ya na Literature na Mahadum Sorbonne Paris na 1961[1] [2] [1]
Ọrụ
dezieFonlon malitere ọrụ ya dị ka onye nkuzi nkuzi na 1940-1941. Ọ bụ onye na-akwado njikọta Cameroon, e mesịkwara họpụta ya dị ka onye na-ahụ maka ọrụ onye isi ala Cameroon bụ Ahmadou Ahidjo, e nyekwara ya nhọpụta nke osote minista na-ahụ Maka ihe gbasara mba ọzọ na 1964, minista na na-ahụkarị njem, post na nkwukọrịta na 1968. N'afọ 1971, Ahidjo wepụrụ Fonlon n'ọkwa ya.[3]
N'afọ 1972, Fonlon ghọrọ Prọfesọ nke edemede na Onye isi ngalaba na Mahadum Younde, Cameroon. Fonlon bụ onye nkuzi dere usoro akwụkwọ gụnyere A Case of Early Bilingualism (1963), Will We Make or Mar (1964), To Every Son of Yusuf Amuda Gobir Nso (1965), Under the Sign of the Rising Sun (1965), na The Task of the Day (1966). [1]
Ndụ na ọnwụ
dezieLee edemede na festschrift Socrates na Cameroon: The Life and Works of Bernard Nsokika Fonlon nke Nalova Lyonga dezigharịrị (1989) 2010, ntinye na Historical Dictionary of the Republic of Cameroon pp. 124-125 na obituaryies nke Chilver's [4] na Andrew Kishani [5].[6][7]
Edensibia
dezie- ↑ 1.0 1.1 1.2 Uwechue (1991). Makers of Modern Africa (Second ed.). United Kingdom: Africa Books Limited, 236–237. ISBN 0903274183. Kpọpụta njehie: Invalid
<ref>
tag; name ":0" defined multiple times with different content - ↑ Uwechue (1991). Makers of modern Africa. United Kingdom: Africa Books Ltd up, 236–237. ISBN 090327418-3.
- ↑ Stark (1976). "Federalism in Cameroon: The Shadow and the Reality". Canadian Journal of African Studies / Revue Canadienne des Études Africaines 10 (3): 423–442. DOI:10.2307/483799. ISSN 0008-3968.
- ↑ Chilver (April 1987). "Bernard Nsokika Fonlon, 1924–86". Africa 57 (2): 259. DOI:10.1017/s0001972000031065. ISSN 0001-9720.
- ↑ Kishani (1986). "In Memoriam:Bernard Fonlon, 1924–86". Présence Africaine (3): 220–225. DOI:10.3917/presa.139.0220. ISSN 0032-7638.
- ↑ Lyonga, Nalova [1989] (2010). Socrates in Cameroon: The Life and Works of Bernard Nsokika Fonlon. Cameroon: African Books Collective / Langaa Research and Publishing Common Initiative Group. ISBN 978-9-9565-7808-5.
- ↑ DeLancey, Mark Dike, 1973- (15 June 2019). Historical Dictionary of the Republic of Cameroon. Rowman & Littlefield. ISBN 9781538119686. OCLC 1102416649.