Benita Sena Okity-Duah
ụdịekere | nwanyị |
---|---|
mba o sị | Ghana |
aha enyere | Benita |
ụbọchị ọmụmụ ya | 19 Jụn 1976 |
Ebe ọmụmụ | Anloga |
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | Bekee |
ọrụ ọ na-arụ | Onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị, onye mmebe ejiji |
Ọkwá o ji | Member of the 6th Parliament of the 4th Republic of Ghana |
ebe agụmakwụkwọ | London College of Fashion, Achimota School |
oge ọrụ ya (mmalite) | 2012 |
onye otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị | National Democratic Congress |
okpukpere chi/echiche ụwa | Efefe Kraịst |
Ihe nrite | Miss Ghana |
Benita Sena Okity-Duah (amụrụ na 19 Juun, na afọ 1976) bụ onye Ghana na-emepụta ejiji, onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị na onye bụbu onye omeiwu maka mpaghara Ledzokuku na mpaghara Greater Accra .[1]
Mbido ndụ na agụmakwụkwọ
dezieA mụrụ ya na 19 Juun, na afọ 1976 na Anloga na mpaghara Volta nke Ghana .[2] O meriri asọmpi Miss Ghana na afọ 1997 mgbe ọ dị afọ 20 dị ka nwa akwụkwọ.[3] Ọ gara Achimota School na Accra maka agụmakwụkwọ ụlọ akwụkwọ sekọndrị ya. Ọ gara n'ihu na-amụ ejiji na London School of Fashion ruo afọ anọ.[4]
Ọrụ
dezieỌ laghachiri Ghana n'afọ 2003 ma kemgbe ahụ, ọ kpụrụ onwe ya niche na ụlọ ọrụ ejiji Ghana.[5]
Ndọrọ ndọrọ ọchịchị
dezieBenita gbara arụkwaghịm dị ka onye nhazi ụmụ nwanyị nke National Democratic Congress nke mpaghara Ledzokuku na mpaghara Greater Accra. O sonyere na ntuli aka nke pati ma merie onye omeiwu nke oge ahụ bụ Nii Nortey Dua iji nọchiteanya National Democratic Congress na mpaghara ahụ. O meriri ntuli aka na 2012 iji nọchiteanya ndị Ledzokuku na ndị omeiwu nke Ghana. Ọ ghọrọ onye mbụ Miss Ghana beauty queen ka a họpụtara dị ka onye otu ndị omeiwu na Ghana.[4] Tụkwasị na nke a, ọ rụrụ ọrụ dị ka osote minista na-ahụ maka mmekọahụ, ụmụaka na nchekwa ọha na eze nke Ghana site n'Epriel, na afọ 2013 ruo June 2014.[6] Ọ bụkwa osote minista na-ahụ maka ịkụ azụ na aquaculture nke Republic of Ghana.[7] Benita tụfuru oche ya n'aka Dr. Benard Okoe-Boye onye guzo na tiketi nke New Patriotic Party na ntuli aka ndị omeiwu nke afọ 2016.[8]
Ndụ onwe onye
dezieBenita lụrụ Steve Okity-Duah. A mụrụ ya Benita Golomeke, e chiri ya okpueze Embassy pleasure Ms Ghana na afọ 1997. Ọ bụ Onye Kraịst na onye otu The Church of Jesus Christ of Latter-day Saints.[9]
Ebenside
dezie- ↑ Member of Parliament. www.parliament.gh. Parliament of Ghana. Archived from the original on 8 December 2016. Retrieved on 30 July 2016.
- ↑ Vieta, Kojo T., 1962- (2013). Know your MPs in the 6th Parliament : (2013-2017). Accra: Flagbearers Publishers. ISBN 978-9988-1-8039-3. OCLC 869428481.
- ↑ Photos: Miss Ghana 1997 Benita Sena Okity-Duah at 2013 Ghana Movie Awards!. www.ghanagist.com. Ghanagist.com. Archived from the original on 24 July 2019. Retrieved on 30 July 2016.
- ↑ 4.0 4.1 Benita Sena Okity-Duah Goes To Parliament…First Ever Miss Ghana Beauty Queen To Enter Parliament. www.ghanacelebrities.com. Ghana Celebrities (2012-12-14). Retrieved on 30 July 2016.
- ↑ Vieta, Kojo T., 1962- (2013). Know your MPs in the 6th Parliament : (2013-2017). Accra: Flagbearers Publishers. ISBN 978-9988-1-8039-3. OCLC 869428481.
- ↑ Parliament approves nomination of 35 deputy ministers-designate. www.myjoyonline.com. Multimedia Group (29 April 2013). Archived from the original on 27 August 2016. Retrieved on 16 August 2016.
- ↑ Ministerial reshuffle: Nii Lantey Vanderpuye out?. www.myjoyonline.com. Multimedia Group (2 June 2014). Archived from the original on 2016-08-22. Retrieved on 16 August 2016.
- ↑ Miss Ghana Loses Ledzokuku Seat - Daily Guide Africa (en-US). dailyguideafrica.com (2016-12-09). Archived from the original on 25 February 2017. Retrieved on 2017-02-25.
- ↑ Ghana MPs - MP Details - Okity-Dua, Sena Benita. ghanamps.com. Retrieved on 2020-01-25.