Batilda Salha Burian

Batilda Salha Burian
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịTanzania Dezie
Aha enyereBatilda Dezie
aha ezinụlọ yaBurian Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya19 Ọktoba 1965 Dezie
Asụsụ obodoSwahili Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee, Swahili Dezie
Ọrụ ọ na-arụOnye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Dezie
Ọkwá o jiMember of the National Assembly of Tanzania Dezie
ebe agụmakwụkwọUniversity of London Dezie

Batilda Salha Burian (amụrụ n' ọnwa October 19, 1965) bụ onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị na onye nnọchi anya na mba Tanzania. Ugbu a, ọ bụ onye nnọchi anya Tanzania na mba Japan.[1]

Akụkọ ndụ ya dezie

Burian nwetara PhD ya na Mahadum College nke London na afọ 1992.[2]

Ọ rụrụ ọrụ ugboro abụọ na Nzukọ Ndị Omeiwu, site na afọ 2000 ruo afọ 2005 na 2006 ruo na afọ 2010.[2] N'etiti oge ọ nọ na Nzukọ Ndị Omeiwu, ọ bụ osote Minista nke Mmepe Obodo, Mmekọahụ na Ụmụaka.[1] Mgbe Nzukọ Ndị Omeiwu gasịrị, ọ ghọrọ Kọmishọna Ukwu (ma ọ bụ onye nnọchi anya) nke Tanzania na Kenya.[3] N'oge ọ bụ onye nnọchi anya na Kenya, ọ gara n'ihu na-eme ka mmekọrịta dị n'etiti mba abụọ ahụ sikwuo ike, na-ekwu na mba abụọ ahụ nwere ọtụtụ ihe jikọrọ ha ma na ọdịbendị ma na gburugburu ebe obibi.[4] N'afọ 2015, ọ ghọrọ onye nnọchi anya Tanzania na Japan.[1]

Burian bụ onye isi oche nke World Climate Change Forum III na afọ 2009 na Geneva ma bụrụkwa onye nnọchi anya Tanzania na mba United Nations Environment Program (UNEP).[4]

Ebesidee dezie

  1. 1.0 1.1 1.2 Mwangonde. "Burian Moved to Japan from Kenya as Ambassador", The Citizen, 6 February 2015. Retrieved on 19 July 2015.
  2. 2.0 2.1 Hon. Dr. Batilda Salha Burian. Parliamentary Online Information System. The Parliament of Tanzania. Archived from the original on 24 March 2021. Retrieved on 19 July 2015.. Parliamentary Online Information System. The Parliament of Tanzania. Retrieved 19 July 2015.
  3. Message from the High Commissioner Dr. Batilda Salha Burian. Tanzania: High Commission, Nairobi. Archived from the original on 20 July 2015. Retrieved on 19 July 2015.
  4. 4.0 4.1 "Diplomacy of Development: 'Tanzania - Kenya Ties Built to Last'", Diplomat East Africa, 6 May 2014. Retrieved on 19 July 2015.