Barbro Cecilia Johansson

Barbro Cecilia Johansson (September 25, 1912 na December 7, 1999) bụ onye ozi ala ọzọ Swedish-Tanzanian.[1][2]

Akụkọ ndụ ya dezie

A mụrụ Barbro na St. John's Parish Malmö, obodo nke atọ kachasị ukwuu na Sweden na ọnwa Septemba 12, nke afọ 1912. Ọ bụ nwa nwanyị nke Anders Johansson na onye nkuzi ụlọ akwụkwọ Betzy Persson Hussénius. Mgbe ọ gụsịrị akwụkwọ ịghọ onye nkuzi na Sweden, ọ gara Tanzania (nke a maara dị ka Tanganyika) na afọ 1946 iji jee ozi na Chọọchị Sweden (Chọọchị Evangelical Lutheran Swedish state). Mgbe ọ nọ n'ọkwa ya na Tanzania, ọ kwadoro iwu ụlọ akwụkwọ ụmụ nwanyị na Kashasha, Bukoba na afọ 1949, a họpụtakwara ya ka ọ sonye na ndị omeiwu mba ahụ na afọ 1959 dị ka onye nnọchi anya mpaghara Mwanza na onye otu Tanganyika African National Union (TANU), nke mechara jikọta ya na Chama Cha Mapinduzi. O mechara bụrụ onye minista dị mkpa na Gọọmentị Tanzania.[1][3]

Ọ bụkwa onye isi ụlọ akwụkwọ ụmụ nwanyị, onye ndụmọdụ onye nnọchi anya Tanzania na Sweden, onye otu Mahadum Dar es-Salaam ma na-arụsi ọrụ ike mgbe niile n'imeziwanye agụmakwụkwọ ndị okenye. Ka oge na-aga, ọ ghọrọ ezigbo enyi nke Onye isi ala Julius Nyerere. Ọ pụtakwara maka nnwere onwe na mpaghara ndị ọzọ nke ndịda Afrịka, dị ka African National Congress. Ọ natara nzere doctorate na Mahadum Gothenburg n'afọ 1968 ma nye ya (Illis quorum) n'afọ 1990.[4][5][6][7]

Ebesidee dezie

  1. 1.0 1.1 (1980) Maelezo binafsi ya wagombea ubunge wa taifa, jumuiya, 1980 (in sw). Juwater. 
  2. Larsson. Barbro Cecilia Johansson. Svenskt kvinnobiografiskt lexikon. Retrieved on 2022-05-22.
  3. Svenskan som tog plats i Tanzanias parlament (sv). www.dagen.se. Retrieved on 2017-11-17.
  4. Genomförda aktiviteter. TanzaniaProjectet (2007-09-28). Archived from the original on 2007-09-28. Retrieved on 2017-11-17.
  5. Tudo - Snabbt. Användarvänligt. Enkelt.. www.tudo.se. Retrieved on 2017-11-17.
  6. LIBRIS - Hedersdoktorer vid Göteborgs ... (sv). libris.kb.se. Retrieved on 2017-11-17.
  7. Regeringens belöningsmedaljer och regeringens utmärkelse: Professors namn (sv). Regeringskansliet (January 2006). Archived from the original on 2021-11-02. Retrieved on 2022-05-18.

Ịgụ ihe ọzọ ya dezie

  • Barbro Cecilia Johansson at Svenskt kvinnobiografiskt lexikon