Aster Gebrekirstos
ụdịekere | nwanyị |
---|---|
mba o sị | Ethiopia |
aha enyere | Aster |
Ebe ọmụmụ | Shire |
ọrụ ọ na-arụ | dendrochronologist |
onye were ọrụ | World Agroforestry Centre |
ebe agụmakwụkwọ | Haramaya University |
Ihe nrite | Fellow of the African Academy of Sciences |
webụsaịtị | https://www.worldagroforestry.org/staff/aster-gebrekirstos |
Aster Afwork Gebrekirstos FAAS TWAS bụ nwanyị ọkàmmụta sayensị na Etiopia na ọkammụta na ngalaba Agroforestry na World Agroforestry Center (ICRAF)
Mmalite Ndụ na Agụmakwụkwọ Ya
dezieA mụrụ Aster Gebrekirstos na Shire, mpaghara Tigray, Etiopia dị ka nwa mbụ n'ezinụlọ ụmụ asaa. O bu n'obi ịbụ dọkịta mana nsonaazụ ụlọ akwụkwọ sekọndrị emeghị ya ka o toruo ịgụ ya, ma ọ ga-ahọrọ n'etiti ikuzi nkuzi na ịmụ maka ọhịa, o wee họrọ ịmụ maka ọhịa. [1][2] O nwetara nzere B.Sc na ngalaba Forestry site na Mahadum Haramaya. Ọ nọrọ na Mahadum Haramaya dị ka onye nnyemaaka gụsịrị akwụkwọ ozugbo o nwetara nzere bachelọ ya tupu ya erite Fellowship Netherland wee mezue nzere M.Sc ya na Mahadum Nnyocha Wageningen (1996 – 1998). Ọ nwetara ọkwa nkuzi na Wondo Genet College of Forestry, Mahadum Hawassa. [3] Enyere ya akwụkwọ ịgụ akwụkwọ N'efu German Academic Exchange Service (DAAD) iji Nweta nzere Ph.D ya na Mahadum Gottingen na Germany (2001-2005). Mgbe ọ mesịrị PhD, ọ sonyere dị ka onye nnyocha nwetara ka ọkankuzi ya na ngalaba Biophysics na Biochemistry, Mahadum Umeå, Sweden (2006 – 2008) tupu ọ gaa World Agroforestry Center | ICRAF, Kenya na University of Göttingen | Mahadum Göttingen, Germany (2009-2011).
Ọrụ na Nnyocha Ya
dezieDịka onye dendrochronologist, o hiwere ụlọ nnyocha dendrochronology na Etiopia n'afọ 2009, ụlọ nnyocha dendrochronology na Wondo Genet College of Forestry and Natural Resources n'afọ 2010, na ụlọ nyocha dendrochronology nke World Agroforestry Center na Kenya n'afọ 2013. [4][5] Nnyocha ya na-elegide anya na Dendroisotopy [6][7] mgbanwe ihu igwe,[8][9] mmekọrịta dị iche iche nke akụrakụ na mmiri ,[10][11] na ọmụmụ maka ọhịa òtù o si metụta onye na ibe ya.[12] Gebrekirstos bụ onye ọkammụta nleta na West African Science Service Center for Climate change Adapted Land Use (WASCAL) program, Dresden University of Applied Sciences, Centre for International Postgraduate Studies of Environmental Management (CIPSEM). [13][14][15] Ọ na-eje ozi dị ka onye isi oche Kọmitii gburugburu African Academy of Sciences na osote onye nhazi nke IUFRO Task Force on Global Tree Mortality Patterns and Trends, Mountain Research Institute Science Leadership Council. [16][17][18]
Onyinye na nkwanye Ùgwù
dezieA họpụtara ya ka ọ bụrụ onye òtù African Academy of Sciences n'afọ 2017,[4] Onye òtù World Academy of Sciences n'afọ 2021,[14] na onye òtù International Academy of Wood Sciences n'afọ 2021. [17][18]
N'afọ 2014, e nyere ya onyinye nturu ugo ihu igwe nke Afrịka maka nnyocha nke ọma na mgbanwe ihu igwe na mbelata. Ọ bụkwa onye mmeri nke 2019 Special Award for Ground Breaking Science; Ndị ọkachamara na-eto eto na ndị inyom na asọmpi sayensị nke Africa bụ nke Technical Center for Agricultural and Rural Cooperation ACP-EU (CTA), African Technology Policy Studies (ATPS) haziri, Alliance for a Green Revolution in Africa (AGRA), Forum for Agricultural Research in Africa (FARA), Regional Universities Forum for Capacity Building in Agriculture (RUFORUM), na New Partnership for Africa's Development, (NEPAD). [4][14][15]
Akwụkwọ Ndị Ebipụtara Ahọpụtara
dezie- Aster Gebrekirstos, Ralph Mitlöhner, Demel Teketay, Martin Worbes (2008/10). Climate–growth relationships of the dominant tree species from semi-arid savanna woodland in Ethiopia. Trees 22:631-641
- Aster Gebrekirstos, Demel Teketay, Masresha Fetene, Ralph Mitlöhner (2006). Adaptation of five co-occurring tree and shrub species to water stress and its implication in restoration of degraded lands. Forest Ecology and Management 229:1-3 259-267
- Aster Gebrekirstos, Martin Worbes, Demel Teketay, Masresha Fetene, Ralph Mitlöhner (2009/4/1). Stable carbon isotope ratios in tree rings of co-occurring species from semi-arid tropics in Africa: patterns and climatic signals. Global and Planetary Change 66:3-4 253-260
- Abiyu A, Mokria M, Gebrekirstos A, Bräuning A. (2018). Tree-ring record in Ethiopian church forests reveals successive generation differences in growth rates and disturbance events. Forest Ecology and Management 409: 835–844.
- Mokria M, Gebrekirstos A, Abiyu A, Noordwijk M, Bräuning A. (2017). Multi‐century tree‐ring precipitation record reveals increasing frequency of extreme dry events in the upper Blue Nile River catchment. Global Change Biology 23: 12 5436–5454.
Edensibia
dezie- ↑ Earth, Oceans and Skies.
- ↑ Earth, Oceans and Skies | African Women in Science (en).
- ↑ Aster Gebrekirstos (ICRAF).
- ↑ 4.0 4.1 4.2 Afwork Gebrekirstos Aster | The AAS. Archived from the original on 2022-11-28. Retrieved on 2023-12-05.
- ↑ Tree ring laboratory opens at ICRAF.
- ↑ (2021-01-04) Agroforestry for Degraded Landscapes: Recent Advances and Emerging Challenges - Vol. 2 (in en). Springer Nature. ISBN 978-981-15-6807-7.
- ↑ Tropical forests in Africa's mountains store more carbon than previously thought – but are disappearing fast (en).
- ↑ Food and Agriculture Organization of the United Nations (2019-11-29). Climate change vulnerability assessment of forests and forest-dependent people: A framework methodology (in en). Food & Agriculture Org.. ISBN 978-92-5-131981-9.
- ↑ 10 Women Scientists Leading the Fight Against the Climate Crisis (en).
- ↑ Aster Gebrekirstos (ICRAF).
- ↑ O'Connell, Erin (2022-08-23). Green water and flying rivers.
- ↑ (2022-01-12) State of the Art in Ethiopian Church Forests and Restoration Options (in en). Springer Nature. ISBN 978-3-030-86626-6.
- ↑ Aster Gebrekirstos (en).
- ↑ 14.0 14.1 14.2 Gebrekirstos, Aster (en).
- ↑ 15.0 15.1 Aster Gebrekirstos (en-US).
- ↑ IUFRO: Officeholder Aster Gebrekirstos Afwork / Who is Who.
- ↑ 17.0 17.1 Aster Gebrekirstos (en-US).
- ↑ 18.0 18.1 TWAS elects 35 new TWAS Fellows (en).