Arne Husveg (11 Febụwarị 1933 - 16 Nọvemba 2004) bụ onye ndú nzukọ Norwegian na onye na-ahụ maka ikike ndị nwere nkwarụ.

Amuru ya na Stavanger, okpuru is mgbe odi afo abuo. E mere examen artium na 1952. O gara na mahadum nke Exeter, Vienna na Florence ruo na 1955, o ruru oru dika onye ntughari Ihe otutu afo. Bido na 1963 ruo na 1971 o ruru oru dika onye physiotherapist.

Husveg bụ onye guzobere Norwegian Federation of Organisations of Disabled People na 1950. O sonyekwara na Norwegian Association of the Blind and Partially Sighted, ma sonye na mgbakọ mba ha na nke mbụ ya na 1951. Ọ bụ onye isi oche nke nzukọ ahụ maka otu oge, site na 1969 ruo 1971, ma site na 1971 ruo 1994 ọ rụrụ ọrụ dị ka odeakwụkwọ ukwu ha.

Ọ bụkwa onye isi oche nke Federation of Organisations of Disabled People site na 1979 ruo 1983, ebe ọ bụ onye otu bọọdụ site na 1969 ruo 1979. O so guzobe European Blind Union na 1984, ọ bụkwa onye otu bọọdụ ruo ọtụtụ afọ yana onye isi oche site na 1987 ruo 1996. Site na 2000 ruo ọnwụ ya ọ bụ osote onye isi oche nke World Blind Union. Ọ nọchitere anya Socialist Left Party na kansụl obodo Oslo.

E ji Royal Norwegian Order of St. Olav na ihe nrite kachasị elu nke World Blind Union, Louis Braille Medal chọọ Arne Husveg mma. Ọ lụrụ di ugboro abụọ - na 1956, ọ lụrụ Anne Bolley na 1987, ọ lụrụ onye nkuzi kọleji Else Momrak Haugan. Ọ nwụrụ na Nọvemba 2004 na Oslo .