Anna Mahase
Anna Mahase (1932/1933 - 24 Mee 2024) bụ onye nkuzi na onye nchịkwa Trinidadian. Ọ bụ onye isi ụlọ akwụkwọ sekọndrị St. Augustine Girls' High School na Trinidad na Tobago. Ọ bụ kọmishọna izi ihe nke Republic of Trinidad na Tobago. A mara ya maka ozi ọ na-eje n'agụmakwụkwọ yana ndị otu ọha na ndị ọrụ ebere ndị ọzọ.
Mbido ndụ na agụmakwụkwọ
dezieA mụrụ Mahase n'ime obodo Guaico, Trinidad, nye Kenneth Mahase na Anna Mahase (Sr.). Nne ya bụ nwanyị India mbụ ghọrọ onye nkuzi na Trinidad na Tobago na 1918.[1] Nna ya bụ onye isi ụlọ akwụkwọ yana nne ya bụ onye nkuzi n'ọtụtụ ụlọ akwụkwọ Canada Mission (CM). Ha abụọ kere òkè n'ịzụlite agụmakwụkwọ mbụ na ime obodo North East Trinidad[1]
Mahase gara ụlọ akwụkwọ Guaico CM (Guaico Presbyterian Primary School), Naparima Girls' High School sochiri ya na San Fernando. Mgbe nke ahụ gasịrị, ọ gụrụ akwụkwọ na Mahadum Mount Allison na New Brunswick, Canada, gụsịrị akwụkwọ na BSc na BEd.
Mahase mechara nweta nzere nsọpụrụ nke Doctor of Laws site na Mahadum Mount Allison na nke ọzọ site na Machịum nke West Indies.
Ọrụ
dezieMgbe ọ gụsịrị akwụkwọ, Mahase laghachiri Trinidad na Tobago ma mgbe a họpụtara ya ka ọ bụrụ onyeisi ụlọ akwụkwọ St. Augustine Girls' High School. Ọ bụ nwanyị mbụ nọ n'ógbè ahụ nwere ọkwa a. Ihe ndị ọ rụzuru na echiche ya ghọrọ ụkpụrụ maka ọtụtụ ụlọ akwụkwọ sekọndrị ndị ọzọ.
N'oge ogologo ọrụ ya, Mahase natara ọtụtụ onyinye na nsọpụrụ gụnyere Medal of Merit (Gold) (1976) na Chaconia Medal (Gold), a họpụtakwara ya n'ime mmadụ iri ise kachasị elu iji nweta ihe magburu onwe ya na agụmakwụkwọ na ọrụ ọha na eze pụrụ iche iji cheta ncheta afọ iri ise nke nnwere onwe Trinidad na Tobago na 2012.
Ọnwụ
dezieMahase nwụrụ n'ụlọ ọgwụ onwe onye na St Joseph, na 24 Mee 2024, mgbe ọ dị afọ 91.[2]
Ihe odide
dezie- ↑ Kisson (8 September 2007). Born to teach. Trinidad and Tobago Newsday. Archived from the original on 2014-09-07. Retrieved on 6 June 2012.
- ↑ Dr. Anna Mahase dies at 91. Trinidad Express Newspapers (24 May 2024). Retrieved on 24 May 2024.