Angélique Delahaye
ụdịekere | nwanyị |
---|---|
mba o sị | France |
Aha ọmụmụ | Angélique-Mathilde-Andrée Prud'hon |
aha enyere | Angelique, Mathilde, Andrée |
aha ezinụlọ ya | Delahaye |
ụbọchị ọmụmụ ya | 22 Febụwarị 1963 |
Ebe ọmụmụ | Lyon |
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | French language |
ọrụ ọ na-arụ | Onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị, onye ọchụnta ego, farm operator, syndicalist, Q97767869 |
Ọkwá o ji | Member of the European Parliament, Mayor of Saint-Martin-le-Beau, Q66499946, Q65520801, Member of the European Parliament |
ebe agụmakwụkwọ | Tours University |
Ebe ọrụ | Strasbourg, City of Brussels |
onye otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị | Union for a Popular Movement, The Republicans, Rurality Movement |
candidacy in election | first round of the 2022 French legislative election |
Onye òtù nke | Fédération nationale des syndicats d'exploitants agricoles |
Ihe nrite | Officer of the Legion of Honour, Knight of the Legion of Honour |
Angélique Delahaye (amụrụ na 22 Febụwarị 1963) bụ onye ọrụ ugbo na onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke France. Ọ bụ onye isi oche nke Fédération nationale des producteurs de légumes (English: National Federation of Vegetable Producers) site na 2001 ruo 2012, na onye otu ndị nduzi nke Féderación nationale des syndicats d'exploitants agricoles (English) Ọ rụrụ ọrụ dị ka onye otu European Parliament site na 2014 ruo 2019, ọ bụkwa onye isi obodo nke Saint-Martin-le-Beau site na 2014 rue 2020.
Mbido ndụ na ọrụ ugbo
dezieA mụrụ Delahaye na Lyon ma too na Soisy-sur-Seine. Ọ malitere ọrụ ugbo ya n'afọ 1989, ya na di ya Thierry na-elekọta ugbo akwụkwọ nri na Saint-Martin-le-Beau, Touraine. N'afọ 1991, ọ sonyeere ndị nduzi nke Fédération nationale des producteurs de légumes (FNPL) (English: National Federation of Vegetable Producers), alaka nke Féderación nationale des syndicats d'exploitants agricoles (FNSEA) (Engish: National Federation for Agricultural Holders' Unions). Ọ ghọrọ onye isi oche nke FNPL, ya mere ọ bụ onye otu ndị nduzi nke FNSEA, n'afọ 2001, na-ejide ọkwa ahụ ruo n'afọ 2012.[1] Kemgbe afọ 2013 ọ bụkwa onye isi oche nke Solaal (Association Solidarité des producteurs agricoles et agroalimentaires) (English: Solidarity association of agricultural and agro-food producers), ma nata ọkwa nke Knight na Officer of the Legion of Honour maka ọrụ ya, ebe e buliri ya n'ọkwa onye isi na July 2021.[2][3]
Ọrụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị
dezieDelahaye banyere na ndọrọ ndọrọ ọchịchị na 2010, nke Hervé Novelli kwadoro, onye ya na ya rụkọrọ ọrụ mgbe ọ bụ odeakwụkwọ nke steeti maka azụmahịa. A họpụtara ya ka ọ bụrụ onye kansụl mpaghara maka Centre-Val de Loire na ntuli aka mpaghara France nke afọ 2010, ma mesịa gbaa arụkwaghịm n'ọkwa ya na FNSEA. Na Machị 2014, a họpụtara ya ka ọ bụrụ onye isi obodo nke Saint-Martin-le-Beau n'isi nke ndị UMP.[1][2]
N'ọnwa Mee afọ 2014, a họpụtara Delahaye ka ọ bụrụ onye omeiwu Europe, site na nkwado nke Bruno Le Maire na Jean-François Copé bụ ndị mere mkpọsa maka Brice Hortefeux ka ọ bụrụ ya onye ibe ya.[4]
Na Jenụwarị 2020, Delahaye kwupụtara na ọ ga-agba ọsọ maka oge nke abụọ dị ka onye isi obodo nke Saint-Martin-le-Beau. Alain Schnel meriri ya na ntuli aka mbụ na Machị, na-enweta 39.03% nke votu.[2][5]
Ihe odide
dezie- ↑ 1.0 1.1 Angélique Delahaye, une agricultrice en route pour le Parlement européen (fr). L'Obs. Archived from the original on 4 August 2021. Retrieved on 4 August 2021. Kpọpụta njehie: Invalid
<ref>
tag; name ":0" defined multiple times with different content - ↑ 2.0 2.1 2.2 Angélique Delahaye brigue un second mandat (fr). lanouvellerepublique.fr. Retrieved on 4 August 2021. Kpọpụta njehie: Invalid
<ref>
tag; name ":1" defined multiple times with different content - ↑ Promotion du 14 juillet : des personnalités agricoles récompensées - (fr-FR). Terres et Territoires (15 July 2021). Archived from the original on 4 August 2021. Retrieved on 4 August 2021.
- ↑ Angélique Delahaye (UMP) fait à 51 ans son entrée au Parlement européen (fr-FR). France 3 Centre-Val de Loire. Archived from the original on 4 August 2021. Retrieved on 4 August 2021.
- ↑ Saint-Martin-le-Beau (37270) : résultats des élections municipales 2020 - Premier tour (fr). lanouvellerepublique.fr. Retrieved on 4 August 2021.