Alice Alaso (mgbe ụfọdụ a na-akpọ Alice Alaso Asianut) (amụrụ na 21 Jenụwarị na afo 1969) bụ onye nkuzi na onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Uganda bụ onye nnọchi anya nwanyị maka Serere District na omeiwu nke asatọ, nke itoolu na nke iri nke Uganda. Ọ nwere njikọ ndọrọ ndọrọ ọchịchị na Forum for Democratic Change (FDC) ma bụrụ odeakwụkwọ ukwu mbụ nke pati ahụ ruo afọ iri.[1]

Alice Alaso
Alice Alaso
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịUganda Dezie
Aha enyereAlice Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya21 Jenụwarị 1969 Dezie
Ọrụ ọ na-arụonye nkuzi, Onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Dezie
Ọkwá o jimember of parliament Dezie
ebe agụmakwụkwọMakerere University Dezie
onye otu ndọrọ ndọrọ ọchịchịAlliance for National Transformation Dezie

Mmalite na agụmakwụkwọ dezie

Alaso nwetara nzere Bachelor of Arts na Education na Mahadum Makerere .[1]

Ọrụ dezie

Dị ka onye nkuzi, Alaso kụziri na Teso College Aloet n'etiti afọ 1993 na afo 1997.[1] N'oge a, ọ kụzikwaara nwa oge na Saint Mary's Madera.[1]

Mgbe ọ hapụsịrị Teso College na afo 1997, ọ ghọrọ onye isi Gender District na Post-Conflict Recovery Program nke na-ahụ maka Kaberamaido District.[1]

N'afọ 2018, Alaso hapụrụ Forum for Democratic Change ebe ọ na-eje ozi dị ka odeakwụkwọ ukwu.[2] Ndị ọzọ na-ekwu na a chụpụrụ ya na pati na ọnọdụ ahụ.[3]

Ọ sonyeere Alliance for National Transformation (ANT) ma malite na Machị afo 2022, edepụtara ya dị ka onye nhazi mba nke pati ahụ.[1]

Ndụ onwe onye dezie

Alaso lụrụ Johnson Ebaju kemgbe afọ 2007.[4]

Ihe odide dezie

  1. 1.0 1.1 1.2 1.3 1.4 1.5 Know Your Leaders. theallianceug.com. Retrieved on 2022-03-11. Kpọpụta njehie: Invalid <ref> tag; name ":0" defined multiple times with different content
  2. FDC in Serere celebrates Alaso's departure from party (en). New Vision. Retrieved on 2022-03-11.
  3. FDC Sacks Alice Alaso, Wadri, Winnie Kiiza’s Husband (en-US). ChimpReports (2018-12-07). Retrieved on 2022-03-11.
  4. Omoding. "MP Alaso Wedding Splits Churches", The New Vision, 26 December 2007, pp. 2. Retrieved on 11 March 2022.