Alexander Pagenstecher (onye na-ahụ maka anya)

Friedrich Alexander Hermann Pagenstecher (21 Eprel 1828 - 31 Disemba 1879), bụ onye Germany na-ahụ ma ka anya nke amụrụ na Wallau.

Alexander Pagenstecher (1828-1879)

Ọ gụrụ ọgwụ na Mahadum nke Gießen, Heidelberg na Würzburg. Ọ nwetara nzere doctorate ya na afọ 1849, na afọ 1851 gara Paris iji mụọ ophthalmology. N'afọ 1856, o guzobere ụlọ ọgwụ ya na Wiesbaden, ọ bụkwa onye nduzi ya ruo mgbe ọ nwụrụ n'afọ 1879. Na Wiesbaden, ya na nwanne ya nwoke, Hermann Pagenstecher (1844-1932), rụkọrọ ọrụ, onye weghaara ụlọ ọgwụ anya mgbe ọ nwụsịrị.


Pagenstecher, nyere aka n'ọtụtụ ihe gbasara anya, a makwaara ya n'ụwa niile ma ka ọgwụgwọ glaucoma na cataracts. A na-echeta ya ma ka iwebata usoro ịwa ahụ a maara dị ka intracapsular cataract extraction, na afọ 1862 ọ webatara Präcipitatsalbe na-acha odo odo (precipitate salve) dị ka ihe na-egbu egbu an ya. Pagenstecher nwụrụ na ọwa 31 Disemba afọ 1879, site na mmerụ ahụ o nwetara n'ihe mberede ịchụ nta.

Ọrụ ndị ọ dèrè dezie

  • Klinische Beobachtungen aus der Augenheilanstalt na Wiesbaden (ya na Edwin Theodor Saemisch na Arnold Pagenstecher). 1861/62
  • Ueber die Extraction des grauen Stares bei uneröffneter Kapsel durch den Skleralschnitt, Wiesbaden 1866.[1]


Edemsibe dezie

  1. [1] Deutsche Biographie, Pagenstecher, Alexander

Njikọ mpụga dezie