Ahmed Mu'azu
Ahmed Tijani Mu'azu, OON, (amụrụ na ụbọchị isii nke ọnwa itoolu n’afọ 1957), bụ onye nlekọta isi oche gara aga nke Independent National Electoral Commission . Ọ nọchiri Mahmood Yakubu n'ụbọchị itoolu n'ọnwa itoolu n'afọ 2020 mgbe oge ọchịchị mbụ ya gwụrụ,
Mmụta na ọrụ
dezieAmụrụ Mu'azu na Gombe, Gombe Steeti . O nwere Mmụta ya na Gombe Steeti, Kaduna Steeti na Borno Steeti n'ime afo 1964 na afo 1975. N'ọnwa June afo 1976, ọ banyere ndị agha ụgbọ elu nke Naijiria ebe ọ nwere isi mbido ọzụzụ ndị agha ya na Ụlọ mmụta mgbachite Naijiria ruo ọnwa Disemba afo 1979 mgbe e nyere ya ọkwa onye ọkwọ ụgbọ elu. Site na-afo 1979 ruo afo 1991, ezigara ya ọrụ njikwa ụgbọ elu na ọdụ ụgbọ elu Murtala Muhammed na Mallam Aminu Kano International Airport . N’afọ 1988, Mu’azu mere ọrụ mmụta ya nke obere ndị ọrụ na ọdụ ndị agha na ndị isi ndị agha dị na Jaji . N'ime afọ 1991 na afọ 1992, ọ gara ọrụ ndị isi na ndị ọrụ na Ghana Armed Forces Staff College, dị n'obodo Teshie, Accra. [1] [2]
Site na 2003 ruo 2004, ọ bụ onye otu National War College, Ọmụmụ nke iri n'abụọ na National War College mgbe ahụ (ugbu a, National Defense College) . N'afo 2005, o nwetara MSc na mmụta usoro dị omimi na Mahadum nke Ibadan . [1]
Mu'azu nwetara ọkwa air vice marshal na-afọ 2007 wee laa ezumike nká n'onwe ya n'afọ 2013. N’afọ 2016, onye isi ala Naịjirịa, Muhammadu Buhari, họpụtara ya dịka kọmishọna National Independent National Electoral commissiont. [1] [3] [4]
Onye Nlekọta isi oche INEC
dezieN'ụbọchi itoolu n'onwa iri n'otu nke afo 2020, a họpụtara Mu'azu dị ka onye nlekọta isi oche nke Independent National Electoral Commission iji nọchie Mahmood Yakubu onye oge ọchịchị mbụ ya gwụrụ. [5]
Ntụgharị
dezie- ↑ 1.0 1.1 1.2 Sodiq (20 February 2019). CLOSE-UP: This is Ahmad Mu’azu, the man in charge of INEC logistics. TheCable. Retrieved on 19 November 2020.
- ↑ National Commissioners. Independent National Electoral Commission. Archived from the original on 26 November 2020. Retrieved on 19 November 2020.
- ↑ Yakubu hands over to Ahmed Mu’azu as acting INEC chairman. The Guardian Newspaper (9 November 2020). Archived from the original on 13 November 2020. Retrieved on 19 November 2020.
- ↑ 2016 INEC Commissioners nominees. placng.org. Archived from the original on 27 November 2020. Retrieved on 19 November 2020.
- ↑ Sanni. "INEC appoints Mu’azu as Acting Chairman", Premium Times, 9 November 2020. Retrieved on 19 November 2020.