Ago-Oba

ngalaba ntuli aka na Abeokuta, Najaria

Ago-Oba bụ ngalaba ntuli aka iri na atọ dị n'obodo Abeokuta, Ogun Steeti, Naịjiria. Ọ bụ akụkụ nke okpuru ọchịchị ime obodo Abeokuta ndịda ọwụwa anyanwụ .

Ago Oba, Ogige nke Oba bụ obodo dị na mpaghara Egba nke Abeokuta nke ndị mmadụ na-azọrọ na ha sitere na Alaeze Oba n' oge ochie. Ọ bụghị ihe doro anya ma e guzobere Ago Oba n'ihi mbata nke ndị Egba n'oge agha Yoruba nke narị afọ nke iri na iteghete ma ọ bụ ma ndị mmadụ rutere n'oge gara aga.   Obodo nta ndị dị n'okpuru Alaeze Oba bụ: Obodo Pakudi, Obodo Agbamaya, Obodo Lodan, Obodo Oluribido, Obodo Abuletuntun, Obodo Obodo Olorunda, Obodo Ikeja, Obodo Omilende, Obodo Agbanikanda, Obodo Igboti na Obodo Akija

Ọrụ akụ na ụba bụ azụmaahịa, ime akwa, ọrụ aka na ọrụ njem.Ndị mmadụ isii ruo iri abụọ na-ebi n'ụlọ, na-eji olulu mmiri na-adịghị omimi maka mmiri. Mmiri a anaghị emezu ụkpụrụ nke ọgbakọ ahụike nleta nke mbà ụwa, ma mgbe a na-agwọghị ya, ọ na-akpata nnukwu ihe ize ndụ ahụike.[1]N'oge gara aga, idei mmiri na-eme n'ogige ahụ, mana n'oge na-adịbeghị anya, e meela mgbalị iji melite mmiri.Ndị Anglịkan nọ na Ago-Oba Parish na-eje ozi site na ụlọ ụka ndị St. Michael's.[2]

Ndị ama ama

dezie

Onye bụbu gọvanọ steeti Ogun bụ Olusegun Osoba nwere utu aha ọdịnala nke Oluwo nke Ago-Oba, n'etiti ndị ọzọ.[3]Na ntuli aka onye isi ala nke ọnwa Eprel afọ 2011. Osoba tụbara vootu ya na Ago-Oba maka onye na-azọ ọkwa Nuhu Ribadu nke ndọrọ ndọrọ ọchịchị Action Congress nke Naijiria. Ribadu bụ onye mmeri doro anya na ngalaba ahụ, na vootu otu narị na iri anọ na abụọ na iri isii na ise maka PDP na ise maka CPC.Onye bụbu onye isi ala Olusegun Obasanjo bụ onye Owu. Mgbe nwunye ya Stella Obasanjo nwụrụ n'afọ 2005, e si Legọsị́ weta ozu ya na ụlọ ụka ndị mmeri dị na Ago-Oba, ebe a kpọgara ya ka e lie ya n'ụlọ ezinụlọ Obasanjo dị nso na Ita-Eko.[4][5]Alexander Abiodun Adebayo Bada afọ 1930 rue 2000, onye ndú nke abụọ nke ụka Celestial ndị otu Christị Uwa nile gbara Gburugburu, bụ nwa Baale, ma ọ bụ onye isi nke Ago-Oba, onye bụbu onye isi oche nke ụlọ ikpe omenala Ikeja na Legọsị na onye na-akpọ ụbọ akwara nke ụlọ ụka Afrikan na Ereko-legosị́. [6]Seriki nke Egbaland, Dr. Lateef Adegbite, nwere ọfịs ya na Ago-Oba. [7]

Mgbanwe ihu igwe

dezie

Ago-Oba na Abeokuta, Naijiria, nwere okpomọkụ na-ekpo ọkụ ma ọ bụ okpomọkụ ma ọ bụ savanna ma dị na ịdị elu nke mita iri asaa na otu màrà iri asaa na abụọ ụkwụ narị abụọ nà iri atọ na ise màrà atọ n'elu oke osimiri Nchịkọta: Aw. Okpomọkụ nke mpaghara ahụ kwa afọ nke oC irí abụọ na iteghete mara irí ise nà atọ, oF iri asatọ na ise mara irí na ise bụ uma pacenti asaskarịa nkezi mba maka Naịjirịa. Ihe dị ka milimita òtù narị na iri anọ na abụọ màrà iri anọ na iteghete, sentimita ise màrà iri isii na otu nke mmiri ozuzo na narị abụọ na iri abụo na ise mara irí isii na abụọ ụbọchị mmiri pacenti iri isii na otu màrà iri asatọ na otu nke oge bụ ngụkọta kwa afọ maka Ago-Oba, [8]

Ọnọdụ ihu igwe Ago-Oba Abeokuta: Ọnọdụ ihu ọha site n'ọnwa

dezie

Edensibia

dezie
  1. E.O. Orebiyi (2010). "Assessment of Pollution Hazards of Shallow Well Water in Abeokuta and Environs, Southwest, Nigeria". American Journal of Environmental Sciences 6 (1): 50–56. DOI:10.3844/ajessp.2010.50.56. ISSN 1553-345X. 
  2. ABEOKUTA WEST ARCHDEACONRY. Church of Nigeria. Archived from the original on 2011-09-26. Retrieved on 2011-06-11.
  3. George Oji (January 13, 2002). PDP Should Forget Yorubaland, Says Adesanya. ThisDay. Archived from the original on February 9, 2013. Retrieved on 2011-06-11.
  4. Stella Obasanjo interred in Abeokuta. The Guardian (Oct 28, 2005). Archived from the original on February 9, 2013. Retrieved on 2011-06-11.
  5. Stella's body arrives in Abeokuta, burial rites begin. BNW News (October 28, 2005). Retrieved on 2011-06-11.
  6. Bada, Alexander Abiodun Adebayo. Dictionary of African Christian Biography. Archived from the original on 2010-12-28. Retrieved on 2011-06-11.
  7. Moshood Adebayo (October 19, 2008). Egba chiefs to Daniel: Apologise to Alake. The Sun (Nigeria). Archived from the original on 2011-08-10. Retrieved on 2011-06-11.
  8. Abeokuta, Ogun, NG Climate Zone, Monthly Averages, Historical Weather Data. tcktcktck.org. Retrieved on 2023-08-31.