Aduke Alakija

Ọkaiwu Nwanyị Naijeria

Jaiyeola Aduke Alakija (onye amụrụ March 1921 ma nwụọ March 2016) bụ onye nnọchi anya obodo Naijiria na Sweden site na 1984 ruo 1987. Ọ bụkwa onye ọka iwu na onye ọrụ na-ahụ maka ọdịmma ndị obodo Naijiria. E nwere mgbe ọ bụ isi nke ndi International Federation of Women Lawyers.

Ndụ dezie

Alakija bụ ada amụrụ n'ezinụlọ Adeyemo Alakija, naanị ya bu otu nwa nwaanyi na nwa-ikpeazụ nne na nna ya mụrụ. Ọ malitere ịgụ akwụkwọ na Claxton House School, nke dị na Marina Lagos tupu ọ je gụsizie akwụkwọ n'obodo Wales na 1930 ụlọ akwụkwọ Penrhos College. O bu ụzọ chọọ ịmụ ọgwụ na Mahadum Glasgow mana ọ gafere na London School of Economics ịga mụọ sayensị gbasara ndi mmadụ. Ka ọ gusiri lọta Naịjirịa, ọ rụrụ ọrụ dịka onye ọrụ ọdịmma na ngalaba ikpe nke Lagos[1][2] ebe ọ bidoro ịmepụta ụlọ ikpe ụmụaka ma mee ka e nwee ọtụtụ klọb ụmụ nwanyị na Lagos, o nyekwara aka na nguzobe British Leprosy Relief Association nke alaka ụlọ ọrụ dị na Lagos[3]. N'afọ 1949, ka Alakija hapụrụ Naịjirịa ịmụ akwụkwọ iwu, wee buru onye ọka iwu n’afọ 1953. ya na enyi ya nwaanyi, Miss Gloria Rhodes, bidoro ọrụ ọka iwu na ụlọ ọrụ John Idowu Conrad Taylor. Maka ntakiri oge, ọ hapụrụ ọrụ iwu ka ọ rụọ ọrụ dịka onye na-ahụ maka ọdịmma ndị mmadụ, wee bụrụ nwanyị mbụ Naijiria ga-ejide ọnọdụ ahụ.[4]

Alakija rụrụ orụ dika onye enyemaka otu n'ime ndị njikwa nke Mobil Oil mesịa bụrụ onye isi na onye ndụmọdụ gbasara iwu na Mobil Oil Nigeria na 1957.[5] N’afọ 1961, Mobil natara ikike maka nyocha mmanụ na Naịjirịa, mgbe ahu ka Alakija mechara bụrụ onye nduzi na Mobil. N’afọ 1967, ọ bụ onye isi oru nke ndi Lagos State Chamber of Commerce. Site na 1961 rue 1965, o bu onye otu ndi nnọchi anya Nigeria na United Nations.


Alakija so na onye okike ụlọ akwụkwọ nke New Era Girls College, onye otu International Women Society of Nigeria na onye otu Soroptimist International .

O nwere asambodo nsopuru mmuta na Barnard College.

Ebe m si dee dezie

  1. Balogun, Hairat. "Ambassador Jaiyeola Aduke Alakija, A Toast and Tribute", April 12, 2016.
  2. "Alakija, Aduke". 2005. In The Palgrave Macmillan Dictionary of Women's Biography, edited by Jennifer S. Uglow, Frances Hinton, and Maggy Hendry. Basingstoke: Macmillan Publishers Ltd.
  3. Little, Kenneth. African Women in Towns: An Aspect of Africa's Social Revolution. 
  4. Balogun, Hairat. "Ambassador Jaiyeola Aduke Alakija, A Toast and Tribute", April 12, 2016.
  5. Little, Kenneth. African Women in Towns: An Aspect of Africa's Social Revolution.