Abdin Mohamed Ali Salih
ụdịekere | nwoke |
---|---|
mba o sị | Sudan |
aha n'asụsụ obodo | عابدين محمد علي صالح |
aha enyere | Salih |
ụbọchị ọmụmụ ya | 1 Jenụwarị 1944 |
Ebe ọmụmụ | Wad Madani |
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | Sudanese Arabic, Bekee |
ọrụ ọ na-arụ | academic, professor |
ụdị ọrụ ya | civil engineering, ecology |
onye were ọrụ | University of Khartoum, UNESCO |
ebe agụmakwụkwọ | University of Khartoum, Imperial College London, University of Padua |
ogo mmụta | doctorate, Doctor of Philosophy, diploma |
Ebe ọrụ | University of Khartoum, King Saud University |
okpukpere chi/echiche ụwa | Okpukpere Alakụba |
Ihe nrite | Fellow of the African Academy of Sciences, TWAS fellow |
Abdin Mohamed Ali Salih FAAS FTWAS FIWRA (amụrụ 1944) [1] bụ onye mba Sudan bụ ọkammụta na ngalaba Civil Engineering Mahadum Khartoum nakwa ọkachamara UNESCO na Akụnụba si na mmiri.[2][3]
Mmalite Ndụ na agụmakwụkwọ Ya
dezieA mụrụ Salih na Wad Madani, Sudan na 1944.[1] Ọ bụ ezie na e dere ụbọchị ọmụmụ ya dị ka 1 Jenụwarị, nke a nwere ike ọ gaghị abụ eziokwu. N'oge amụrụ ya, e kenyere abalị mbụ nke ọnwa Jenụwarị maka ndị a mụrụ na mpụga Khartoum, ọmụmaatụ, Abdalla Hamdok na Omar al-Bashir. Salih banyere na Khartoum University| Mahadum Khartoum n'afọ 1963 wee nweta nzere Bachelor of Science n'ógó First Class Honors na ngalaba Civil Engineering. N'afọ 1969 o nwetara nzere Diploma of Imperial College wee gaa n'ihu mechaa Doctor of Philosophy na Hydraulics n'afọ 1972 sitere na Imperial College London. O mechara nweta Diploma na Hydrology na Mahadum Padua Italy, n'afọ 1974 [2][4][5]
Ịme Nnyocha na ọrụ Ya
dezieMgbe omwetachara nzere PhD ya Salih laghachiri na Sudan n'afọ 1973 wee sonye na ngalaba nke injinia nke Mahadum Khartoum dị ka onye nkuzi tupu ọ bụrụ onye ọkammụta nsonye n'afọ 1977, onye isi ngalaba nke Civil Engineering n'afọ 1979. , na onye ọkammụta zuru oke n'afọ 1982. Ọ ghọrọ onye osote onye isi oche Mahadum Khartoum n'etiti 1990 na 1991. Dị ka ebe Nọvemba 2022, ọ bụ ọkammụta na ngalaba Civil Engineering, Mahadum Khartoum na onye so na Kansụl Na-achị Isi nke Mahadum Khartoum nakwa Mahadum Sayensị na Teknụzụ nke Sudan. Ọ bụkwa onye ọkammụta na College of Engineering, Mahadum King Saud, site n'afọ 1982.[5][4][6] Ọrụ ime nnyocha na inye ndụmọdụ Salih lekwasịrị anya na nchekwa mmiri na njikwa akụrụngwa mmiri. Ọ jere ozi na UNESCO site na 1993 ruo mgbe ọ ghọrọ onye ntụzi aka nke ngalaba Water Sciences n'afọ 2011 [7][8][3] and was a member of the Executive Board of UNESCO from 2015 until 2019.[9][10] Ọ bụbukwa Gọvanọ ọzọ nke Kansụl n'ahụ maka mmiri nke mba ụwa n'etiti 1999 na 2003. [2] Salih na-arụ ọrụ dịka onye ndụmọdụ maka Kọmishọn Ukwu maka mmepe Riyadh, Saudi Arabia, ọ bụ onye òtù nke ọtụtụ òtù n'ahụ maka mmiri na mba ụwa ,[11] ma bụrụkwa onye juri nke ọtụtụ ihe nrite mmiri mba ụwa.[12]
Ihe Nrite na Nkwanye Ùgwù Ya
dezieA họpụtara Salih dịka onye òtù nke International Water Resources Association (FIWRA) n'afọ 1983,[5], onye òtù African Academy of Sciences (FAAS) n'afọ 1993,[2][13] na onye òtù The World Academy of Sciences (FTWAS) n'afọ 2002.[14] Enyere ya ihe nrite Islamic World Educational, Scientific and Cultural Organisation (ISESCO)'s Award for Excellence in Scientific Research.[8]
Ndụ Onwe Onye Ya
dezieSalih alụọla nwanyị jiri ụmụ atọ .[1]
Akwụkwọ Ndị Ebipụtara Ahọpụtara
dezie- Abdin M. A Salih, Uygur Sendil (1984-09-01). Evapotranspiration under Extremely Arid Climates. Journal of Irrigation and Drainage Engineering. 110 (3): 289–303. doi:10.1061/(ASCE)0733-9437(1984)110:3(289). ISSN 0733-9437.
- Solaiman A. Al‐Sha'lan, Abdin M. A. Salih (1987-11-01). Evapotranspiration Estimates in Extremely Arid Areas. Journal of Irrigation and Drainage Engineering. 113 (4): 565–574. doi:10.1061/(ASCE)0733-9437(1987)113:4(565). ISSN 0733-9437.
- Abdin M. A. Salih, Ibrahim, Nagwa (1998-12-15). UNESCO's international hydrological program and sustainable water resources management in the Arab region. Desalination. Selected papers presented at The Third Gulf Water Conference Towards Efficient Utilization of Water Resources in the Gulf Water Science and Technology Association (WSTA). 120 (1): 15–22. doi:10.1016/S0011-9164(98)00197-0. ISSN 0011-9164.
- Abdin M. A. Salih (1980-10-01). Entrained Air in Linearly Accelerated Water Flow. Journal of the Hydraulics Division. 106 (10): 1595–1605. doi:10.1061/JYCEAJ.0005531.
- Abdin M. A. Salih (1985-01-01). The Nile Inside the Sudan—Increasing Demands and Their Consequences. Water International. 10 (2): 73–78. doi:10.1080/02508068508686311. ISSN 0250-8060.
Ihe Ndị Nhụwa Ama
dezie
Hụkwa
dezieEdensibia
dezie- ↑ 1.0 1.1 1.2 Abdin Mohamed Ali Salih | Just another UofK site. Archived from the original on 2022-11-13. Retrieved on 2023-12-04.
- ↑ 2.0 2.1 2.2 2.3 Salih Abdin Mohamed Ali | The AAS. Archived from the original on 2022-11-13. Retrieved on 2023-12-04.
- ↑ 3.0 3.1 iAgua, redaccion (2011-10-05). Abdin Mohamed Ali Salih, nuevo Director para la División de Ciencias del Agua y Secretario del PHI de la UNESCO (es).
- ↑ 4.0 4.1 بروفسور عابدين محمد على صالح بقلم بخيتة امين (ar).
- ↑ 5.0 5.1 5.2 CV. Archived from the original on 2022-11-13. Retrieved on 2023-12-04.
- ↑ Cssp.
- ↑ Euro-Mediterranean Information System on know-how in the Water sector - International portal. Archived from the original on 2023-02-27. Retrieved on 2023-12-04.
- ↑ 8.0 8.1 Side Event at the ICSU Forum on Science, Technology and Innovation // "Water security" A New Paradigm of Adaptive Management | Nexus - The Water, Energy & Food Security Resource Platform.
- ↑ Advisory and Consulting Contributions | Abdin Mohamed Ali Salih (en-US). Archived from the original on 2022-11-13. Retrieved on 2023-12-04.
- ↑ Wagner elected as new Chair of UNESCO-IHE (en-US) (2015-12-05).
- ↑ Advisory and Consulting Contributions | Abdin Mohamed Ali Salih (en-US). Archived from the original on 2022-11-13. Retrieved on 2023-12-04.
- ↑ Stephenson, David (2005). Water services management / { Prof. Abdin Mohamed Ali Salih collection }. London: Lightning Source UK Ltd. ISBN 978-1-84339-080-0.
- ↑ Abdin Mohamed Ali Salih's biography, net worth, fact, career, awards and life story - ZGR.net.
- ↑ Salih, Abdin Mohamed Ali (en).