Ababel Yeshaneh
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịEthiopia Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya22 Julaị 1991 Dezie
Ebe ọmụmụEthiopia Dezie
Ọrụ ọ na-arụasọmpi egwuregwu Dezie
ụdị egwuregwuegwuregwu Dezie
ịdọ aka ná ntị egwuregwu asọmpimarathon Dezie
so naegwuregwu n'egwuregwu Olimpik Summer 2016 Dezie

Mkpúrù èdè íke'''Mkpurụ okwu sélénsé Ababel Yeshaneh Birhane (amụrụ na ọnwa Julaị 22 n'afọ 1991) bụ onye Etiopia na-agba ọsọ ogologo oge nke na-asọmpi n'okporo ụzọ na ihe omume gafere mba. Ọ nọchitere anya mba ya na mita 10,000 na 2013 World Championships in Athletics, na-agba onye nke itoolu, ma bụrụ nke ise n'ụwa n'oge n'afọ ahụ. Ọ bụ onye nwetara ọlaọcha n'otu egwuregwu na African Cross Country Championships na afọ 2014 wee bụrụ onye nke iri na anọ na mita 5000 na-egwuregwu 2016 Olympic.

N'afọ 2020, n'abalị iri abụọ na otu na ime ọnwa Febrụwarị, ọ mebiri ihe ndekọ ụwa na ọkara marathon, na 1:04:31 na RAK Half-Marathon dị na Ras Al Khaimah, United Arab Emirates.

O nwere marathon kacha mma nke 2:20:51 setịpụrụ na 2019 Chicago Marathon ebe ọ gbara onye nke abụọ.

Mgbe ọ na-agba ọsọ na Etiopia, ọ banyere klọb egwuregwu nke ndị agha nchekwa nke Etiopia.[1] Ọ malitere ịsọmpi na mpụga Etiopia na afọ 2011, ọ malitere site na mmeri na Vadodara Half Marathon na India. O sochiri mmeri ahụ anya site n' imerikwa na Stramilano na nkeji 69:54, wee gbaa onye nke abụọ na Nice Half Marathon izu ole na ole n' ihu.[2] O nwetere marathon mbụ ya n'afọ ahụ, bụrụ onye nke isii na Turin Marathon na oge nke 2:34:36 awa na ọnwa Nọvemba.[3] Ọ gbara ọsọ nke ọma n' afọ 2012, n' ezie o setịpụrụ ụzọ nke kachasị mma na mita 5000 nke nkeji 15:17.05.[4]

Ababel gbara onye nke atọ na Milan Marathon n'ọnwa Epurel afọ 2013, na-etinye ihe kachasị mma nke awa 2:33:10 .[5] Kama, ọ bụ n'okporo ụzọ ka ọ gosipụtara ike ya. Na nzukọ Golden Spike Ostrava ọ so ná ndị kachasị n' asọmpi 10,000 mita nke oge ahụ na oge ya nke 30:35.91 nkeji maka nke anọ mechara bụrụ nke ise n'ụwa n'oge n'afọ ahụ.[6] Egwuregwu ahụ mere ka o nweta ọnọdụ na ndị otu Etiopia maka 2013 World Championships in Athletics, mgbe onye ndu ụwa Meseret Defar kpebiri ilekwasị anya na 5000 m. Na 10,000m nke ikpeazụ n'ụwa, ọ nọ n'isi ruo n'etiti tupu ọ laghachi n'ọnọdụ nke itoolu n'ozuzu ya na mba mbụ ya.[7]

Ihe nrite mbụ, mba ụwa ya bịara na 2014 African Cross Country Championships. Ọ bụ onye nke isii n'asọmpi nke ụmụ nwaanyị nke wetara ya ihe nrite ọlaọcha dị ka isonye otu ụmụ nwaanyị Etiopia nke Tadelech Bekele duziri.[8] Mgbe nke a gasịrị, ọ laghachiri n'ọsọ okporo ụzọ, na-abịa nke anọ na Portugal Half Marathon.[4] Na mbido afọ 2015 ọ meriri akụkụ ọkara marathon nke Ooredoo Marathon na Doha.

O sonyere na marathon ụmụ nwaanyị na World Athletics Championships n'afọ 2022 nke emere na Eugene, Oregon, United States.{| Àtụ:AchievementTable |- || 2013 |World Championships |Daegu, South Korea |9th |10,000 metres || 32:02.09 |- |rowspan=2|2014 |rowspan=2|African Cross Country Championships |rowspan=2|Kampala, Uganda |6th |Senior women's race |26:14.03 |- |bgcolor=silver|2nd |Senior women's team | |-

|}

  1. Negash, Elshadai (12 March 2011). Diro's double, Gari, Assefa highlight Municipal Champs in Addis Ababa. IAAF. Retrieved on 2015-02-12.
  2. Half Marathon – women – senior – outdoor – 2011. IAAF. Retrieved on 12 February 2015.
  3. Marathon – women – senior – outdoor – 2011. IAAF. Retrieved on 12 February 2015.
  4. 4.0 4.1 Ababel Yeshaneh Progression. IAAF. Retrieved on 12 February 2015.
  5. Marathon – women – senior – outdoor – 2013. IAAF. Retrieved on 12 February 2015.
  6. Mulkeen, Jon (27 June 2013). World lead by Adams, five meeting records broken in Ostrava – IAAF World Challenge. IAAF. Retrieved on 2015-02-12.
  7. Minshull, Phil (11 August 2013). Report: Women's 10,000m final – Moscow 2013". IAAF. Retrieved on 2015-02-12.
  8. Kenya makes a clean sweep at African Cross Country Championships. IAAF (16 March 2014). Retrieved on 2015-02-12.