A-One (graffiti artist)

Onye Amerịka omenkà ihe odide
A-One
Mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
mba o sịNjikota Obodo Amerika Dezie
Aha enyereAnthony Dezie
aha ezinụlọ yaClark Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya4 Novemba 1964 Dezie
Ebe ọmụmụManhattan Dezie
Ụbọchị ọnwụ ya12 Novemba 2001 Dezie
Ebe ọ nwụrụ13th arrondissement of Paris Dezie
Ọrụ ọ na-arụgraffiti artist, onye ese, contemporary artist Dezie
Onye òtù nke156 All Starz Dezie
Nwere ọrụ na mkpokọtaKröller-Müller Museum, Groninger Museum Dezie
ikike nwebiisinka dị ka onye okikeỌrụ nwebiisinka chekwara Dezie

Anthony Clark (1964 rụọ úbọchị irí nà otu n'ọnwa Novemba, 2001), nke a maara dị ka A-One, bụ ónyé America na-ese ihe. Ọ mepụtara ụdị ọ kpọrọ "aerosol expressionism".[1]

Ndụ na ọrụ dezie

A mụrụ A-One na Manhattan na 1964 ma too na Mitchel Houses na South Bronx.[1] Ọ bụ nwa Janette Gordon Clark na nwa nwa Mannie Clark Sr., ónyé isi caddy na Mayfair Golf Course na Sanford, Florida na ngwụcha afọ 1950.[2] Ọ malitere ise ihe mgbè ọ dị afọ isii, ma dee ihe odide n'ụgbọ oloko n'etiti afọ ndị 1970.[3] A-One sonyeere ndị ọrụ Rammellzee na-ede ihe Tag Master Killers, nke nwekwara Delta2, Kool Koor, na Toxic.[4] Onye otu ọ bụla mepụtara ụdị nke ha màkà ịhazi akwụkwọ ozi dabere na echiche Rammellzee nke Gothic Futurism, nke na-akọwa graffiti dị ka iji akwụkwọ ozi mee ihe n'ọgụ iji weghachite asụsụ site na "omenala na-adịghị mma" nke nchịkwa mmekọrịta mmadụ na ibe ya.[1] Na mbido afọ 1980, ha so na ndị na-ese ihe na-eweta nka na egwu mbụ site na Bronx na Queens gaa n'ebe nka dị n'etiti ọbọdọ. N'afọ 1982, A-One, Toxic, na Kool Koor sonyere na ihe ngosi otu Camouflaged Panzerism na Fashion Moda na South Bronx.[5]

A-One bụ enyi na ónyé na-arụkọ ọrụ na onye na'ese ihe Jean-Michel Basquiat.[1] Basquiat ghọrọ ónyé nkuzi ya ma kụziere ya otu esi etinye aka na ụlọ ngosi nka.[2] A-One bụ isiokwu nke ihe osise Basquiat Portrait of A-One A.K.A. King (1982), nke rere màkà $ 11.5 nde na 2020, na Anthony Clark (1985).[6][7][8]

N'afọ 1983, A-One sonyere na ihe ngosi Jenny Holzer: Survival Series na A-One, Mike Glier, na Lady Pink na Lisson Gallery na London na ihe ngosi Post-Graffiti na Sidney Janis Gallery na New York.[5] N'afọ 1984, o sonyere n'òtù na-egosi Arte di Frontiera: New York Graffiti na Ịtali, Classical American Graffiti Writers na High Graffiti Artists na Galerie Thomas na Munich, na Rapid Enamel: The Art of Graffiti Na Mahadum Chicago.[9][5] A-One ghọrọ ónyé omenkà kachasị nta sonyere na Venice Biennale na 1984.[2] E gosipụtara ọrụ ya na ihe ngosi Writing the Future: Basquiat and the Hip-Hop Generation na Museum of Fine Arts, Boston site na Ọktoba 2020 ruo Julaị 2021.[1]

A-One nwekwara ọtụtụ ihe ngosi onwe ya: Galeria Salvatore Ala, Milan, Italy na 1983; Piccolo Museum na Lecce, Italy na 1995; na Galerie Quintessens, na Utrecht, Netherlands na 1990; Galleria Salvatore + Caroline Ala na Milan, Italy n'afọ 2010.[3]

Ruo oge ụfọdụ, ọ biri na Verona, Ịtali.[2] O mechara kwaga Paris, ébé ọ gàrà n'ihu na-arụ ọrụ ruo mgbe ọ nwụrụ site na ọbara ọgbụgba ụbụrụ mgbè ọ dị afọ 37 na Nọvemba 11, 2001.[3] Nwanne ya nwoke nke okenye bụ Octavius "Ocky" Clark, ónyé nwetara ọla edo na 1991 Pan American Games.

Edensibia dezie

  1. 1.0 1.1 1.2 1.3 1.4 Dive into "Writing the Future" (en). Museum of Fine Arts, Boston. Retrieved on 2021-01-05.
  2. 2.0 2.1 2.2 2.3 Flewellyn (2009). African Americans of Sanford (in en). Arcadia Publishing, 97–98. ISBN 978-0-7385-6762-4. 
  3. 3.0 3.1 3.2 A-One Biography – A-One on artnet. www.artnet.com. Retrieved on 2021-01-05.
  4. Rammellzee: Graffiti Writer, Artist and Deity "Racing For Thunder" (en-US) (July 25, 2018). Archived from the original on 2019-06-23. Retrieved on 2021-01-05.
  5. 5.0 5.1 5.2 Basquiat and His Contemporaries: Exhibition Timeline (en). Museum of Fine Arts, Boston. Retrieved on 2021-01-05.
  6. Jean-Michel Basquiat - Portrait of A-One A.K.A. King | 20th c. & Contemporary Art Evening Sale New York Monday, December 7, 2020 Lot 16 (en). Phillips. Archived from the original on 2021-04-12. Retrieved on 2021-04-12.
  7. Basquiat's 'Portrait of A-One A.K.A King' to fetch US$15 million at Phillips (en-US). The Peak Singapore - Your Guide to The Finer Things in Life (August 21, 2020). Archived from the original on 2020-09-27. Retrieved on 2021-01-05.
  8. Phillips' 20th Century & Contemporary Art Sale Smashes Artist Records, Realizes $134.6 Million Total (en). ArtfixDaily. Archived from the original on 2021-01-05. Retrieved on 2021-01-05.
  9. Archivio Ferrari > Ricerca: arte di frontiera. www.genusbononiaearchiviofotografico.it. Archived from the original on 2021-05-04. Retrieved on 2021-08-18.