Ụmụ nwanyị ime obodo

Ụmụ nwanyị ime obodo bụ akụkụ dị mkpa nke obodo ime obodo gburugburu ụwa. Ha na-ekere òkè dị mkpa n'ime ime obodo, na-enye nlekọta ma na-etinye aka n'ọtụtụ ọrụ akụ na ụba dị ka ọrụ ugbo, obere azụmaahịa na ọrụ na-abụghị ọrụ ugbo. N'ọtụtụ akụkụ nke ụwa, ụmụ nwanyị ime obodo na-arụsi ọrụ ike ma na-enweta obere ego.[1]

Ụmụ nwanyị ime obodo na nzukọ obodo metụtara microfinace na India. Ụmụ nwanyị nọ n'ime ime obodo na-arụ ọrụ dị mkpa na mmepe ime obodo n'ụwa niile - mgbe enyere ha ohere akụ na ụba na ohere, ha na-agbanwe obodo ha na-etinye ego na akụrụngwa na ọdịmma obodo.

Ụmụ nwanyị na-enwekarị ịkpa ókè n'ihi na anaghị ekwe ka ha nwee otu ala dịka ụmụ nwoke. Ufodu n'ime ihe ha na-enweta anaghị anọgide na nchịkwa ha, n'ihi na nwoke na nwanyị ahaghị nhata ma ọ bụ ịkpa ókè.

Inye ụmụ nwanyị ime obodo ike ga enye aka, ọ bụghị naanị iji belata ịda ogbenye nke ụmụ nwanyị na ezinụlọ di iche n'iche, kamakwa, site n'inye obodo dum ike - ịgbanwe ohere igu akwụkwọ, ọrụ na uru ndị ọzọ nke ime obodo. Iji mata nke a, ndị mba ụwa na-etinyekarị ihe mgbaru ọsọ mmepe mba ụwa nke na-agbaso itinye ego na mmetụta na ndụ ụmụ nwanyị ime obodo, na United Nations na-akwado Ụbọchị Mba Nile nke Ụmụ nwanyị ime obodo. [2]  

Ịda ogbenye dezie

  Ụmụ nwanyị nọ n'ime ime obodo na enwe oghom kpom kwem, ma dị ka ndị ogbenye ma dị ka ụmụ nwanyị.[3] Ụmụ nwanyị nọ n'ime ime obodo na n'obodo ukwu na-eche ihe ize ndụ dị nke ukwu nke ịda ogbenye na ohere akụ na ụba dị nta karịa ụmụ nwoke ibe ha.[4] Ọnụ ọgụgụ ụmụ nwanyị nọ n'ime ime obodo na-ebi na ịda ogbenye mke ukwu ruru ihe dị ka pasent 50 n'ime afọ iri abụọ gara aga.[1] Ụmụ nwanyị nọ n'ime ime obodo na-ebi n'otu ọnọdụ siri ike dị ka ndị nwoke ibe ha, mana ha na-enwe ọdịbendị na ụkpụrụ ndị ọzọ nke na-eme ka ọrụ ha na-aru ghara ịdị mma ma na ahịa ọrụ na-abụghị nke iwu kwadoro, ma ọ bụrụ na ha nwere ike iweta ya. [5] Nnyocha Ụwa niile nke 2009 na-ekwu na "ụmụ nwanyị na-arụ ọrụ dị ukwuu n'ọrụ ugbo na ndụ mmadu n'ime obodo dị ka ọrụ ezinụlọ a na-akwụghị ha ụgwọ, ndị ọrụ ugbo na elekọta onwe ha na ndị ọrụ a na- akwụ ụgwọ, mgbe mgbe na-enweghị ohere maka ala, ụgwọ na ihe onwunwe ndị ọzọ na-arụpụta ihe. "[3][5]

A na-elekarị ihe ụmụ nwanyị na-aru na akụ na ụba ime obodo anya dị ala, ebe ụmụ nwanyị na-arụ ọrụ nlekọta dị ukwu nke ndi mmadu amaghị ama n'ihi na a naghị ele ya anya dị ka nke na-arụpụta ihe maobu nke na-ewta ego.[6] Ọ bụ eziokwu na na mba ụfọdụ omenala na mmekọrịta mmadụ na ibe ya anaghi ekwe ka ụmụ nwanyị ruo ọrụ na abughi oru ezinụlọ, na mba ndị ọzọ, ọkachasị n'ime ime obodo n'Africa, ụmụ nwanyị na-arụ ọrụ dị ka ndị isi na-emepụta nri, na-emeziwanye nri nke ezinụlọ na nchekwa ego. [1][5] Ezinụlọ ndị dara ogbenye nke ukwuu na-adabere n'ọrụ ụmụ nwanyị karia ma n'ime ma n'èzí ụlọ, na-akpata ụbọchị dị ogologo na ọrụ siri ike nke ụmụ nwanyị [1] Ịdị ka ụmụ nwanyị dara ogbenye bụ echiche nke na-emetụta ma n'obodo ukwu ma n' ime obodo.

Ọrụ na obodo ndị ọrụ ugbo dezie

Page 'Gender roles in agriculture' not found

Ụmụ nwanyị nke ọrụ ugbo dezie

Page 'Feminization of agriculture' not found

Mmetụta na nchekwa nri dezie

Page 'Gender and food security' not found

Ihe odide dezie

Ịgụ ihe ọzọ dezie

  1. Kak (1994). "Rural Women and Labour Force Participation". Social Scientist 22 (3/4): 35–59. DOI:10.2307/3517622. ISSN 0970-0293. 
  2. International Day of Rural Women 15 October (en). United Nations. Retrieved on 2023-10-30.
  3. Jazaïry (1992). The State of World Rural Poverty: An Inquiry into Its Causes and Consequences. New York: University Press. ISBN 9789290720034. 
  4. Haynie, Dana L. and Gorman, Bridget K. 1999. “A Gendered Context of Opportunity: Determinants of Poverty across Urban and Rural Labor Markets” The Sociological Quarterly , Vol. 40, No. 2, pp. 177-197.
  5. 5.0 5.1 5.2 World Survey. 2009. “Access to Land, Housing and Other Productive Resources.” Chapter 3, pp. 27–40, and Chapter 4, pp. 41-46
  6. UNICEF. 2007. "Equality in Employment," in The State of the World's Children. New York: United Nations Children’s Fund. Chapter 3, pp. 37–49.