Ọrụ Dibia/Ezenwanyi

Ọrụ Dibia/Ezenwanyị bụ ọrụ omenaala na eji ichụaja, ife mmụọ na ibu arụsị eje ozi. E nwere dibia nwoke ma nwekwaa dibia nwanyị. Na akụkụ obodo ndi na Anambra North Senatorial Zone na aha oyibo, ya bụ obodo ndi ahụ di na mba mmili dika Anam, Nsugbe, Aguleri, Umueri, Nando na Awkuzu, ihe a na-akpọ ụmụ nwanyị na-eme dibia bụ Ezenwanyị mọbụ dibia mmiri. Ọtụtụ ndi dibia bụ ọnatarachi. Nke pụtara na ọrụ dibia/Ezenwanyị ahụ mara ha. O nwere ike ọ bụrụ na nna ha maọbụ nne ha nwere aka ọrụ ahụ, ọ wee maa ha ibụ ndi oje ozi nke arụsi ahụ, n'ihi na a ga-enwerịrị isi ga-ebu ogwe. Dibia na Ezenwanyị nile nwere ọrụ nke ha na-arụ pụrụ iche. Ọtụtụ ndị dibia na Ezenwanyị na-ebu agha megide ndi ibiara igbu mọbụ imegbu ndi chọrọ ha ọru. Ọtụtụ na-agwọ ọgwụ na-enyere ndi ahịa ha aka ire ahia mọbụ chekwaba ha. Ọtụtụ na enye ọgwu maka nria nria di iche dika dimgba, akwụkwụ, iba na ọria ndi ọzọ.[1] E nwere dibia/Ezenwanyị na-achọpụta ihe furu efu na onye zuru ya. Mgbe gboo, ndi dibia/Ezenwanyị anaghi ahụ ọnu ego mọbụ kwuo ihe ndi ahia ha ga-akwụ ha. Ọ bụ ha gwọcha, onye ha jere ozi enye ha ihe masịrị ha. Ha na anarakwa ya na obi ọcha. Ekike ndi dibia/Ezenwanyị nabụkarị akwa ọbara ọbara, akwa ọcha na akwa ojii. Ha na-anya akpa a na-etinye ọgwụ, mkpa akwụkwọ na ihe ofufe nru ha. Ha na-enwekwa onye nso, onye na-ebutere ha ihe onyinye na ihe ndi ọzọ ha nwetara ebe ha gara ọrụ.

Udiri Dibia di Iche Iche dezie

Enwere ọtụtụ dibia na-arụ ọrụ di iche iche:

Dibia afa[2]

Dibia mkpọrọgwụ na mkpa akwụkwọ[3]

Ebensidee dezie

  1. https://www.bbc.com/igbo/afirika-45240668
  2. Archive copy. Archived from the original on 2021-05-15. Retrieved on 2021-05-15.
  3. https://www.bbc.com/igbo/afirika-45240668