Ọrụ Aka
metaclass, second-order class
obere ụdị nkeoccupation Dezie
mụrụ yasociology of professions Dezie
nwere àgwàspecialty Dezie
ndị n'eme yaprofessional Dezie
megidere nkehobby Dezie
Ihe onwunwe WikidataỌrụ ọ na-arụ Dezie

Ọru Aka bụ ọrụ e ji emepụta ihe nka di iche iche. Ihe a na-akpọ ndi na-arụ ya bụ ndi ọrụ aka. Ndi ọrụ aka bụ ndi gara ọzụzụ were turu ugo na nka di iche iche. Ha jiri anya nka na nkuzi ha natara na-arụpụta ihe ndi gụnyere oche, akwa ndina, tebulu na kabinet. Ndi nọ na otu iji osisi aruputa ihe ndia ka a na-akpọ ọkwa nkà. Ndi ọrụ aka gụnyekwara ndi na-akwa akwa, ịkpa akwa,[1] ndi na-esi nri, ndi na-edozi ụlọ, ndi na-eme achịcha, ndi na-edozi ụgboala di iche iche, ndi na-akpa isi,[2] ịkpụ ụzụ[3] na ndi na-edozi akarangwa mebiriemebi. Ọtụtụ n'ime ha bụ ndi nwere onwe ha ma chọtakwa ụmụ ọrụ na-enyere ha aka na ụlọ ọrụ ha. Ọtụtụ bụ ndi ewere na ụlọ ọrụ bekee ka ha na-edozi ihe ndi mebiri emebi ebe ahụ, dika ọkụ, eletrik na jeneratọ. Ọru Aka bụ otu ụzọ di mkpa ndi mmadụ si enye onwe ha ọrụ ma na-ekesakwa ọrụ na ala anyi ọkachasi ugbua ọrụ gọọmentị na adighi. Ndi ọrụ aka jupụtara ebe nile. A naghi-achọ ha achọ na okporo ụzọ m'oli.

Artisans africain


N'oge mbụ, ndi chọrọ ịmụ ọrụ aka na-aga na nke onye nwere ya, kwụọ ya ụgwọ. Ha na-akwụziri ndi ahụ ụru, ihe dịka otụtụ onwa mọbụ otụtụ afọ tupu e duo onye ahụ ka ọmalite nke ya. O ka nwekwara ebe ọ di otu ahụ mbọchi taa. Ma enwekwaziri ọtụtụ ụlọ akwụkwọ, ebe ndi mmadụ na-agakwa mụọ ọrụ aka. Ha na-agụ ya ka e si agụ akwụkwọ na mahadum tupu ha turu ugo pụta mepekwa ya n'ụdị pụrụ iche. Nwoke na nwanyị na-arụ ọrụ aka n'ihi na igbo kwetara na “aka aja aja na-ebute ọnụ mmanụ mmanụ, a rụọ n’anwụ, erie na ndo, ike kete, o rie, onye rụọ, ya erie.[4] Ọzọkwa bụna orụ aka bụ maka ndi na-agba mbọ. I jimatụ, a nahụta ndi igbo dika ndi na-agba mbọ. Ya mere e jiri kwuo so "onye Igbo bụ onye e ji ịgba mbọ mara. Ọ na-agba mbọ ịkpata nke ọ ga-eri, nke ọga-eji nyere nne na nna ya na ọha izugbe aka."[5]

Ebensidee dezie

  1. file:///C:/Users/ADMIN/Downloads/142676-Article%20Text-379291-1-10-20160822.pdf
  2. https://www.bbc.com/igbo/afirika-46556465
  3. https://www.bu.edu/200word/igbo/professions/
  4. https://www.researchgate.net/publication/331935527_Usoro_Aka_Oru_Ndi_Igbo_Ihe_A_Choro_Maka_Ntuteghari_Onodu_Aku_Na_Uba_Iji_Kwusi_Ariri_Na-Eri_Ndi_Igbo
  5. https://www.bbc.com/igbo/afirika-54111128