Ọnọdụ Ihe Oriri na Apụghị Ibunye Ọrịa na Mbà Chaịna
Na mbà Chaịna, bụ mbà kachasị nwee ọnụọgụgụ mmadụ n’ụwa, ọnọdụ ihe oriri na apụghị ibunye ọrịa bụ okwu metụtara ọrụ ugbo ndị Bekee kpọrọ agriculture. Akụkụ ubi Chaịna kacha akọ bụ osikapa, ọka, wiitì, sọyabinsi na ogho. Ihe oriri ndị ọzọ a na-akọpụta na mbà ahụ bụ mkpụrụ osisi na akwụkwọ nri, nke gụnyere apụlụ.[1][2] A bịa n’ihe oriri sitere na anụmanụ, ndị kacha pụta iihe na Chaịna gụnyere anụ ezì, anụ ehi, mmiri ara ehi , na ákwa.[1] Gọọmentị Chaịna (Chinese government) bụ ya na-ahụ maka ihe niile a na-ewepụta n’ọrụ ugbo nakwa òtù esi ekechi ihe oriri, kemịkalụ (additives) eji emezi ihe a kọrọ n'ugbo, na nnukwu igbe eji ebu ihe si n’ugbo aga mbà ọzọ. Gọọmentị na-ahụkwa maka im̀epụta ọgwụ, na iwu banyere azụmahịa. Site n’ikepụta ngalaba ọrụ na-aza State Food and Drug Administration of China n’afọ 2003, goomentị mbà Chaịna gbara mbọ ime ka iwu na-ahụ ka esi eme ka ihe oriri ghara ibunye mmadụ oria guzoro chịm. Ohaneze ndị Chaịna na ndị mbà ọzọ na-ewelisị olu ha ike ịkpọ oku ka akwụsị ihe ọbụla na-eme na ndị mmadụ si na ihe oriri ebute ọrịa. Osote onyeisiala mbà Chaịna, bụ Li Keqiang kwuru na nzukọ ndị na-achị achị State Council na Beijing sị, “Ebe ihe oriri bụ ihe mmadụ ọbụla ga-enwetarịrị, ime ka ihe oriri ghara ibunye mmadụ oria bụ ihe ana aghaghị idebe dị ka ihe mbụ n’usoro e si eme ihe. Nchekwa ihe oriri ka a hapụ isi na ya ebute ọrịa dịwara ka ahụike ( health ) na ndụ mmadụ, otuto akụ na ụba (economic development), na mmekọrịta nke ọgbaaghara na adịghị na ya (social harmony.") [3]
lle ya anya na mkpokọta
dezieIhe oriri na apụghị ibunye mmadụ ọrịa maọbụ ọghọm ọzọ na mbà Chaịna bụ okwu achị̀ obì n’aka ekwu kemgbe ihe karịrị iri afọ atọ gara aga. Nsogbu karịchara na nri ndị na-emepụta ha kpachapụrụ anya tinye ihe na-emerụ ahụ n’ime ha ka ha wee nweta urù karịa. N’ime nri ndị a bụ oke-rie-ọ-nwụọ, ndị kacha pụta ìhè gụnyere nri e jiri ọgwụ na-egbu ahụhụ chekwaa, nri adịgboroja (ya bụ nri ihe e jiri mee ya bụ ihe a na ekwesịghị iji eme ya) na nri e tinyere kemịkalụ na-eme ka nri nọọ ogologo oge ghara imebi. Ihe na-akpali ndị na-emepụta ihe oriri igbaso ụzọ ọjọọ ndị a ha si-emepụta ihe oriri bụ oke-ọchịchọ. Mmepụta nri bụ oke-rie-ọ-nwụọ bụ ihe a haziri nke ọma na ihe bara nnukwu ụba na mbà Chaịna nihi na aka gọọmentị dị na ya.[4]
Ọgbaaghara na-aga n’ihu n’ihe banyere ihe oriri na-eweta ọghọm na mbà Chaịna bịararịị n’ọnọdụ a na amaghị ihe a ga-eme ya afọ iri na anọ gara aga (na mbido afọ 2007). Nke a bụ ka ọ gasịrị nkenke oge ndị State Council na-achị Chaịna gụchara akwụkwọ si n’aka Asian Development Bank, State Food and Drug Administration na World Health Organization kwuru ka a ga-esi na-atụ atụmatụ nakwa etinye n’ọrụ ihe banyere ihe oriri. Akwụkwọ ahụ toro goomentị na mbọ ya, ma kwupụtakwa ebe ndị a ga-elebakwu anya. Nke kacha bụ na a ga-eme ngwangwa hazigharịa ihe ka ngalaba-ọrụ gọọmentị ọbụla sonye nke ọma na ihe a na-eme nakwa wepụta iwu maka ihe oriri. Ngalaba-ọrụ State Food and Drug Administration na-ahụ maka mmepụta na nkesa ihe oriri na ọgwụ wepụtakwara akwụkwọ dere maka nnyocha ha mere na mbido 2007, nke kọwara na mmadụ asaa n’ime mmadụ iri ndi Chaịna kwuru na egwu na-atụ ha n’ihe gbasara ihe oriri na-eweta ọghọm. O teghị aka e mechara nnyocha a, Lu Jianzhong, bụ otù onye n’ime ndị nọ na National Committee of the Chinese People's Political Consultative Conference (CPPCC), na osete onyeisiala mbà Chaịna, Wu Yi, rịọ ka a gbaghara ha. Ha kwere nkwà na gọọmentị ga-ekepụta usoro ga na-ele ihụ na ihe oriri a na-ewepụta bụ nke dị mma oriri.[5]
- ↑ 1.0 1.1 USDA China - Key Statistics Templeeti:Webarchive
- ↑ China - Key Statistics 2005
- ↑ "Chinese vice premier orders more efforts to improve food safety", Xinhua, 2010-04-20.
- ↑ YAN, YUNXIANG (2012). "Food Safety and Social Risk in Contemporary China". The Journal of Asian Studies 71 (3): 705–729. DOI:10.1017/S0021911812000678. ISSN 0021-9118.
- ↑ China Digital Times Apologies for food safety in china Templeeti:Webarchive