Ịkụ ọtụtụ ihe

N'ọrụ ugbo, ọtụtụ akụkụ ma ọ bụ omume nke ịzụlite ihe ọkụkụ abụọ ma ọ bụ karịa n'otu ala n'ime otu afọ, kama naanị otu ihe ọkụkụ. Mgbe a na-akụ ọtụtụ ihe ọkụkụ n'otu oge, nke a na akpokwa intercropping. Usoro Ihe okụkụ a na-enyere ndị ọrụ ugbo aka ịbawanye mmeputa Ihe okụkụ na ego ha na-eweta okpukpo abụọ.[1] Ma, nhọrọ nke ihe ọkụkụ abụọ ma ọ bụ karịa maka ịme multicropping na-adabere na uru otu nke ihe ubi ahọpụtara.

Ịchụcha nwere ike isi ike n'ọtụtụ usoro ihe ọkụkụ ebe a na-ewe ihe ọkụkụ ọnụ. Ọ nwere ike iwere ụdị ihe ọkụkụ abụọ, nke a na-akụ ihe ọkụkụ nke abụọ mgbe e wepụtasịrị nke mbụ. Na Garhwal Himalaya nke India, omume a na-akpọ barahnaja na-agụnye ịgha mkpụrụ 12 ma ọ bụ karịa n'otu ogige ahụ, gụnyere ụdị agwa, ọka, na millets dị iche iche, na owuwe ihe ubi ha n'oge dị iche iche.

Uru nke ọtụtụ ihe ọkụkụ

dezie

Ịnakwere omume nke ọtụtụ ihe ọkụkụ n'ọtụtụ nwere ike inye aka belata nsogbu nri nke mba. Ọnụ ego niile nke ntinye na-ebelata, ọnụahịa a na-emefu na fatịlaịza, ịgba mmiri, ọrụ, dgz. Na-ebelata n'ihi ịzụlite ihe ọkụkụ abụọ ma ọ bụ karịa abụọ n'otu ubi ahụ. Ihe ize ndụ nke uto ahịhịa, nje na ọrịa na-ebelata n'ihi mmekọrịta dị n'ime ihe ọkụkụ. Nke a na-ebute nlekọta ugbo ka mma na mmụba ego onye ọrụ ugbo na-enweta. Otú ọ dị, ọ bụ naanị 5% nke ala ihe ọkụkụ mmiri ozuzo zuru ụwa ọnụ nọ n'okpuru ọtụtụ ihe ọkụkụ, ebe 40% nke ala ihe ubi a na-agba mmiri n'ụwa niile nọ n'etiti ọtụtụ ihe ọkpọ.[2]

Na China, mgbanwe ala na mkpokọta nke ọrụ ugbo mere ka ịkọ ugbo okpukpu abụọ na ndịda nke mba ahụ dị mfe, na-eduga na mmụba dị ukwuu na mmepụta ugbo.[3]: 116 

Hụkwa

dezie

Ebenside

dezie
  1. Abhishek (2020-09-19). MULTIPLE CROPPING- Definition, Benefits and Selection of Crops (en-US). Agriculture Review. Retrieved on 2020-12-14.
  2. Multiple cropping could help feed the world (en-US). CGIAR. Retrieved on 2020-12-14.
  3. Harrell (2023). An Ecological History of Modern China. Seattle: University of Washington Press. ISBN 978-0-295-75171-9.