Victoria Rusoke Businge
ụdịekere | nwanyị |
---|---|
mba o sị | Uganda |
aha enyere | Victoria |
ụbọchị ọmụmụ ya | 3 Jenụwarị 1956 |
Ebe ọmụmụ | Uganda |
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | Bekee, Rutoro |
ọrụ ọ na-arụ | Onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị, onye nkuzi |
Ọkwá o ji | member of parliament, State Minister for Local Government |
Mpaghara ntuli aka | Kabarole District |
ebe agụmakwụkwọ | Makerere University, Kyambogo University |
onye otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị | National Resistance Movement |
Victoria Rusoke Businge nke a makwaara dị ka Rusoke Victoria Businge (amụrụ na 3 Jenụwarị 1956) bụ onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị na onye nkuzi Uganda.[1] Victoria jere ozi dị ka onye nnọchi anya ụmụ nwanyị nke mpaghara Kabarole na nke itoolu nke Nzukọ Ndị Omeiwu nke Uganda.[2] A họpụtara ya ọzọ dị ka onye otu ndị omeiwu nke iri na otu nke Uganda na ntuli aka Jenụwarị puku abụọ na iri na otu. Ọ nwere njikọ na National Resistance Movement . N'afọ 2018, Chief Justice, Hon. Justice Bart M. Katureebe na isi ụlọ ikpe na Kampala.[3][4]
Agụmakwụkwọ na nzụlite
dezieO nwere Master of Education na Mahadum Makerere (2001) wee nweta Bachelor of Education na Маhadum Makerer na 1991. O nwere diplọma na agụmakwụkwọ onye nkuzi site na Institute of Teacher Education, Kyambogo (1986), asambodo onye nkuzi nke Grade II, Mahadum Makerere (1980), na 1977, e nyere ya asambodo agụmakwụkwọ nke East Africa.[2]
Nne Victoria enweghị ike ịkụziri ya ihe karịrị O-level ya mere o nweghị ike iru nrọ ya nke ịghọ onye ọka iwu kama ọ ghọrọ onye nkuzi.[1]
Ọ rụrụ ọrụ dị ka onye isi agụmakwụkwọ distrikti, Kabarole site na 2003 ruo 2010.[1] Site na Febụwarị ruo Julaị 2003, ọ rụrụ ọrụ dị ka onye isi nkuzi na Kalinaabiri Primary School ma bụrụkwa onye isi nkuchi nke Old Kampala Primary School site na 1997 ruo pụkụ abụọ na abuo. Ọ bụ onye isi nkuzi nke City Primary School site na 1994 ruo 1995. Ọ rụrụ ọrụ dị ka osote onye isi nkuzi nke Nakasero Primary School site na 1991 ruo 1993 na dị ka onye nkuzi na Kibuli TTC site na 1986 ruo 1990. Ọ rụrụ ọrụ dị ka onye nkuzi na Shimoni Demonstration School site na 1980 ruo 1985.[2] N'afọ 1978, ọ sonyeere ma rụọ ọrụ na Institute of Teacher Education Kyambogo (ITEK) nke bụzi Mahadum Kyambogo.[1]
- ↑ 1.0 1.1 1.2 1.3 Baranga. Kabarole’s new brooms (en-gb). The Observer – Uganda. Archived from the original on 15 October 2022. Retrieved on 18 March 2021.
- ↑ 2.0 2.1 2.2 Kabarole expects a two-horse race between Businge and Mutuzo (en). Daily Monitor. Retrieved on 18 March 2021.
- ↑ CJ Swears in New UHRC Member. www.judiciary.go.ug. Retrieved on 18 March 2021.
- ↑ UHRC Commissioners (en-GB). Uganda Human Rights Commission (UHRC). Archived from the original on 27 June 2022. Retrieved on 18 March 2021.