Ngozi Okonjo Iweala

Nwa-amaala Naịjiria, bụ nwanyị a ma ama n'okwu ego na akụnụba
Ngozi Okonjo Iweala
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
aha n'asụsụ obodoNgozi Okonjo-Iweala Dezie
Aha enyereNgozi Dezie
aha ezinụlọ yaOkonjo, Iweala Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya13 Jụn 1954 Dezie
Ebe ọmụmụOgwashi Ukwu Dezie
ŃnàChukuka Okonjo Dezie
nwaUzodinma Iweala Dezie
Asụsụ obodoAsụ̀sụ̀ Ìgbò Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee, Asụ̀sụ̀ Ìgbò, pidgin Naịjirịa Dezie
Ala nna ochieOgwashi Ukwu Dezie
Ọrụ ọ na-arụdiplomat, economist, Onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị, minister Dezie
ụdị ọrụ yaeconomics, banking industry, bank management, money management, finance ministry Dezie
onye were ọrụWorld Bank Group Dezie
Ọkwá o jiMinister of Finance of Nigeria, Minister of Foreign Affairs, managing director, Minister of Finance of Nigeria, Director-General of the World Trade Organization Dezie
ebe agụmakwụkwọHarvard University, Massachusetts Institute of Technology, MIT School of Architecture and Planning, International School Ibadan Dezie
affiliation stringFederal Ministry of Finance, GAVI Alliance, Gavi, the Vaccine Alliance, World Trade Organization (WTO) Dezie
onye otu ndọrọ ndọrọ ọchịchịPeople's Democratic Party Dezie
agbụrụNdị Igbo Dezie
Onye òtù nkeGlobal Financial Integrity, World Resources Institute, American Academy of Arts and Sciences Dezie
webụsaịtịhttp://ngoziokonjoiweala.com/ Dezie

Ngọzị Okonjọ-Iweala rụrụ ọrụ dịka Mịnịsta na-ahụ maka ihe niile gbasara ego (Minister of Finance) na Naịjiria. Ọ rụrụ ọrụ mịnịsta ugboro abụọ: sitē n’afọ 2003 rue afọ 2006; sitekwa n’afọ 2011 rue 2015. Tutu ọ rigoo n’ọkwa mịnịsta, ọ rụrụ ọrụ iri afọ abuo na ise n’ọba ego nke mba ụwa rue n'ọkwa "Managing Director" n’ahụ maka otu ọrụ niile si-aga na ya bụ oba ego. Ọ nọrọ n'ọkwa a afọ anọ (site n’afọ 2007 rue 2011). Ugbua, Okonjo-Iweala na-arụ ọrụ n'ọkwa daịrekụtọ jenaralụ n'òtù mbà ụwa a kpọrọ World Trade Organisation bụ òtù na-ahụ maka iwu, atụmatụ, usoro na nhazi azụmahịa mbà na mbà n'ụwa. Ọ bụkwa onyeísīoche bọd na-ewepụta ihē ndị a ga-elegara anya na-èmē ihē n’òtù na-aza Global Alliance for Vaccines and Immunization, nakwa na Standard Chartered Bank, ma sorokwa na bọd ndị Twitter na African Risk Capacity (ARC).[1]

Ndụ na Agụmakwụkwọ Ya dezie

Okonjo-Iweala bu onye Ọgwashị-Ukwu dị na Steti Delta. Nna ya Chukwuka Okonjo bụ ọkà mmụta, bụrụkwa ēzè sitere n’ezinụlọ Ọbahaị bụ ebe e si ewepụta ēzè n'Ọgwashị-Ukwu. Di Okonjo-Iweala bụ Ikemba Iweala, onye dọkịta na-ahụ maka ịwapu ụbụrụ mmadụ ma mezie ihe mebiri na ya. Nwoke a bụ onye Umuahia dị na Stetị Abịa. Chineke jiri ụmụ anọ chọọ alụmdinanwunye ha nma.[2]

N’ụlọ akwụkwọ St. Anne, dị na Molete, Ibadan ka Okonjo-Iweala malitere akwụkwọ. Ka ọ gụchara akwụkwọ elementịrị, ọ gbagoro n’ụlọ akwụkwọ ọzọ dịkwa n'Ibadan aha ya bụ “International School”, gụkwaa ākwụkwọ na mahadum dị na Harvard (Havard University) na mba Njikọ̀taọ̀hà. O tuuru ugo na Havard site na-iji "magna cum laude" na AB gụchaa ākwụkwọ ya n'ekọnọmikisị n'afo 1976. O nwetakwara Ph.D. (Doctor of Philosophy) n'ihe banyere ọnọdụ akụnụba na mmepe obodo. Ọ bụ n'afọ 1981 ka o siri n'ụlọ akwụkwọ ukwu nkà na ụzụ dị na Massachusetts (Massachusetts Institute of Technology) nweta nzere Ph.D. a na mba Emerịka. Òtù ụmụnwanyị na-arụ ọrụ na mahadum na mba Emerịka (American Association of University Women) nyere ya nkwado ego maka ya bụ Ph.D., nihi na ụbụrụ ya dị nkọ.[3]

Ijeozi Ya na Gọọmentị dezie

Okonjo-Iweala rụrụ ọrụ mịnịsta na Gọọmentị Etiti Naịjiria ugboro abụọ. Ọ bụụrụ mịnịsta hụrụ maka ego, bụrụkwa minista hụrụ maka ihe na-eme na mba ọzọ.[4] Dịka nwanyị mbụ nọrọ n’ọkwa abụọ a n'oge Olusegun Obasanjo bụ onyeīsiàlà Naịjiria, ọ nọrọ n’īsi mbọ a gbara ịhụ na òtù Paris Club kagburu nnukwu ụgwọ ijeri iri ato ego mba Emerịka Naịjiria ji ha.[5] Okonjo-Iwala gbakwara mbọ pụrụ iche n’afọ 2003 ịhụ na Naịjiria chekwara ego niile mara n’elu ego e retara na nmanụ petrolu, nke mere na ọnọdụ ọjọọ akụnụba Naijiria nọ na ya n'oge ahụ belatara.[6]

Ọ bụkwa Okonjo-Iweala wepụtara atụmatụ isi n’akwụkwọ ntakụkọ bipụta n’ọnwa ọbụla ego Stetị iri atọ na isii si n'akpaego Gọọmentị Etiti keta n'ótù n'ótù. Atụmatụ a gbara n'anwụ usoro Gọọmentị Etiti gbasoro, mee ka ewu na ọkụkọ hụ ma gọọmentị o tinyere ego n'ọrụ ma ọ bụ na o rifuru ego ọhaneze.[7][8] Nke ọzọ bụ na Okonjo-Iweala gbara mbọ mere ka ndị zara "Fitch Ratings" na ndị na-aza "Standard & Poor’s" debe Naịjiria n'ogogo “BB Minus” n'etiti mba ụwa nweere onwe ha n'ibite ma kwụghachị ụgwọ. Nkea pụtara ìhè n’afọ 2006.[3] Ka ọ rụchara ọrụ nke mbụ ya dịka mịnịsta n’afọ 2007, ọ laghachịrị n’ọ̀bọ̀ego mba ụwa bụ "World Bank" ebe o siri bịa rụọ ọrụ ahụ.[9]

N’afọ 2011, onyeisiala Naịjiria n'oge ahụ, bụ President Goodluck Jonathan kpọghachịtara Okonjo-Iweala n’ọrụ mịnịsta na-ahụ maka ego, ma sịkwa ya chịkọtaba ihe niile banyere akụ na ụba Naịjiria. Otu n’ime ụfọdụ ihe ndị Okonjo-Iweala rụpụtara e ji-echeta ya na njem nke ugboro abụọ a dịka mịnịsta bụ ihiwe usoro ndị ka nma e ji-enweta nakwa na-etinye ego n’ọrụ. Nke ọzọ bụ ihiwe ọ̀bọ̀ego a kpọrọ "Nigeria Mortgage Refinance Corporation (NMRC)"[10] nke nyere aka mee ka ọ dịwanye mfe ndị mmadụ ịgbazite ego maka owuwu ụlọ. Ọzọkwa, Okonjo-Iweala mere ka ego a na-amapụta n'atụmatụ ego ọrụ gọọmentị maka ọdịnma onye ọbụla bụ nwanyị hie nne karịa ka a na-amapụta na mbụ. O hiwekwara atụmatụ ọ kpọrọ Growing Girls and Women in Nigeria Programme (GWIN) na nke ọ kpọrọ Youth Enterprise with Innovation programme (YouWIN). Atụmatụ abụọ a jiri ego na nkuzi kwado ụmụnwanyị ime ihe dị iche iche na-enye ha ego, nke hụrụ na ọnọdụ ụmụagbọghọ na ndị nne gbanwere n’ụzọ ka nma. [11] [12]

[13]

[14]

References dezie