National Health Commission

National Health Commission
Ụlọ ọrụ Gọọmenti, Constituent Department of the State Council
Oge/afọ mmalite17 Maachị 2018 Dezie
aha mkpirisi国家卫生健康委 Dezie
office held by head of the organizationMinister in charge of the National Health Commission Dezie
mba/obodoChina Dezie
Nwe ikikeChina Dezie
Isi ọgbakaState Council of the People's Republic of China Dezie
ọdịdị isi ụlọ ọrụBeijing Dezie
dochieNational Health and Family Planning Commission, Q50839212, State Administration of Work Safety Dezie
akaụntụ weebụsaịtị naTencent Weibo Dezie
webụsaịtịhttp://www.nhc.gov.cn/, http://en.nhc.gov.cn/ Dezie

Kọmịshọn Ahụike nke Mba (nke akpọrọ NHC dị ka aha ịchafụ na asụsụ bekee) nke bụ ngalaba emere maka ihe gbasara ahụike nke onye isi ebe ahụ bụ onye n'ọkwa onye nke so na Kansụl Steeti ma bụrụ kwa onye na-ahụ maka ịhazi amụma gọọmentị na ihe niile gbasara ahụike na Mainland China . [1] E hiwere ụlọ ọrụ na ọnwa Machị na ụbọchị iri na itoolu, n'afọ 2018. Isi ụlọ ọrụ a bụ na nnukwu obodo Beijing n'China. Onye isi na ụlọ ọrụ bụ minista onye nke nwere ọkwa na kansụl steeti onye na -edu kọmiti nke a. Ma Xiaowei bụ onye minista ugbu a na -elekọta Kọmitii ahụ ma bụrụ kwa ode akwụkwọ Alaka nke otu ndị ndọrọ ndọrọ nọ na ọchi-chi. Na mbụ, ụlọ ọrụ na arụ ọrụ ndị Kọmịshọn Ahụike bụ National Health and Family Planning Commission tupu emepụta amụma maka NHC

Akụkọ ihe mere na mbụ dezie

N'ime ọchịchị otu ndị ndọrọ ndọrọ nke a n'akpọ PRC dị ka aha ịchafụ ya na asụsụ bekee, kemgbe afọ 1954, ụlọ ọrụ na ahụ maka ihe niile gbasara ahụike na mba China na mbụ bụ ndị Ministry of Health. Ka'ma nke a gbanwere na afọ 2013 mgbe enyere National Health and Family Planning Commission ike maka nlekọta ahụike na obodo ahụ.

Na ọnwa Machị na afọ 2018, Gọọmentị nke ndị mmadụ nke Republik China kwupụtara na etisara Kọmịshọn Ahụike na Atụmatụ Ezinụlọ. Gọọmentị gara n'ihu kwuo na ha were ọrụ na ịga ozi nke ndị ụlọ ọrụ Kọmịshọn Ahụike na Atụmatụ Ezinụlọ nyefe ndị ụlọ ọrụ ọhụrụ, National Health Commission.

China sokwa n'otu nzukọ ahụike ụwa nke a n'kpọ World Health Organisation na asụsụ bekee ma ọ bụ WHO dị ka aha ịchafụ ya. [2] Minista Ma kọrọ na Mgbakọ Ahụike nke WHO nke iri abụọ na iteghete, na kemgbe afọ 1978, China lekwasịrị anya n'ịkwalite ahụike site na isi, ma mepụta atụmatụ maka nchekwa na ahụisike ndị obodo ahụ site na ime ka onye ọbụla nwee ohere ịnweta nlekọta ahụike nke mbụ nke dị ọgọ ma na arụọrụ nkeọma. [2]

Ọrịa coronavirus 2020 dezie

Kọmịshọn ahụ bụ isi ụlọ ọrụ nke dị na ebe mepere emepe na China na-ahazi mbọ mba iji lụso ọrịa COVID-19 agha.[3]

Na ụbọchị nke iri na otu n'ọnwa February n'afọ 2020, maka iji jikwaa nsogbu ahụike nke COVID-19 na -aga n'ihu, enwere mgbanwe dị iche iche na ụlọ ọrụ National Health Commission. A mara ọkwa ndị a;

  • Zang Jin, onye isi nke kọmitii ahụike na mpaghara Hubei, nọchiri anya Wang Hesheng, onye osote onye isi oche nke ụlọ ọrụ National Health Commission nke China.
  • Wang Hesheng nọchiri Liu Yingzi, onye isi kọmitii ahụike na mpaghara Hubei.

Ndị ụlọ ọrụ nọ n'okpuru dezie

Ụlọ ọrụ ndị a nọ n'okpuru National Health Commission.

Ụlọ ọgwụ dị n'okpuru NHC
  • Ụlọ ọgwụ nke dị n'Beijing
  • Ụlọ ọgwụ nke mmekọrita enyi na enyi nke China-Japan
  • Ụlọ ọgwụ nke mahadum Peking Union

Ndepụta ndị ozi dezie

Ndị minista na -ahụ maka Kọmishọn Ahụike Mba
No. . Aha Mgbe obidoro ọrụ Mgbe ọhapụrụ Ihe edeturu
1 Ma Xiaowei ụbọchị iri na itoolu n'ọnwa Machị n'afọ 2018 Onye na -achị ugbua
Ndị minista na -ahụ maka Kọmishọn Ahụike na Atụmatụ Ezinụlọ
No. Aha Mgbe obidoro ọrụ Mgbe

ọhapụrụ

1 Li Bin ụbọchị iri na isii n'ọnwa Machị n'afọ 2013 n'ọnwa Machị n'afọ 2018
Ndị ozi ahụike
No. Aha Mgbe obidoro ọrụ Mgbe

ọhapụrụ

1 Li Dequan n'ọnwa Nọvemba n'afọ 1949 n'ọnwa Jenụwarị n'afọ 1965
2 Qian Xinzhong n'ọnwa Jenụwarị n'afọ 1965 n'ọnwa June n'afọ 1968
3 Qiu Guoguang (邱国光) n'ọnwa June n'afọ 1968 n'ọnwa June n'afọ 1970
4 Chen Renhong (陈仁洪) n'ọnwa June n'afọ 1970 n'ọnwa Julaị n'afọ 1973
5 Liu Xiangping (刘湘 屏) n'ọnwa Julaị n'afọ 1973 n'ọnwa Ọktoba n'afọ 1976
ohere
6 Jiang Yizhen (江 一 真) n'ọnwa Nọvemba n'afọ 1977 n'ọnwa Eprel n'afọ 1979
(2) Qian Xinzhong n'ọnwa Eprel n'afọ 1979 n'ọnwa Mee n'afọ 1982
7 Cui Yueli (崔 月 犁) n'ọnwa Mee n'afọ 1982 n'ọnwa Machị n'afọ 1987
8 Chen Minzhang (陈敏 章) n'ọnwa Machị n'afọ 1987 n'ọnwa Machị n'afọ 1998
9 Zhang Wenkang n'ọnwa Machị n'afọ 1998 n'ọnwa Eprel n'afọ 2003
10 Wu Yi n'ọnwa Eprel n'afọ 2003 n'ọnwa Eprel n'afọ 2005
11 Gao Qiang n'ọnwa Eprel n'afọ 2005 n'ọnwa June n'afọ 2007
12 Chen Zhu n'ọnwa June n'afọ 2007 ụbọchị iri na isii n'ọnwa Machị n'afọ 2013

Ntụrụaka dezie

 

  1. "Archived copy", ifeng, 2018-03-27. Retrieved on 2019-02-22. (in zh)
  2. 2.0 2.1 China shares experiences in primary health care at 72nd World Health Assembly - Xinhua | English.news.cn. www.xinhuanet.com. Archived from the original on 2020-01-09. Retrieved on 2020-01-25.
  3. 'Grave situation' as coronavirus claims another life. www.9news.com.au. Retrieved on 2020-01-26.