Kukawa

Ọchịchị obodo di na mpaghàrà nke Naijiria
Kukawa
local government area of Nigeria
mba/obodoNaijiria Dezie
dị na ngalaba nhazi mpagharaȮra Borno Dezie
dị na mpaghara ogeUTC+01:00 Dezie
nhazi ọnọdụ12°55′29″N 13°33′58″E Dezie
Map

Kukawa (nke a na-akpọbụ Kuka ) bụ otu n'ime obodo di na ọchịchị ime obodo dị na steeti Borno nke dị na ugwu ọwụwa anyanwụ Naijiria nke dị nso n'ọdọ mmiri Chad .

Ewubere obodo ahụ n'afọ 1814 dị ka isi obodo nke Alaeze Ukwu Kanem-Bornu site n'aka onye nkụzi nkè. Ụka Alakuba na onye agha Muhammad al-Amin al-Kanemi mgbe ọdịda nke isi obodo gara aga, Ngazargamu gasịrị . [1] Obodo ahụ nwere nnukwu atụmatụ dị mkpa, ịbụ otu n'ime ọdụ ndịda nke ụzọ ahia trans-Saharan na- aga Tripoli . [2]

skware etítì n'afọ 1851

Onye Jaman na-eme nchọpụta bụ Heinrich Barth gara obodo ahụ n'afọ 1851 onye si Tripoli bịa na-achọ imepe azụmahịa na mba Eropu na inyocha mba Afrịka, [1] ọzọ n'afọ 1892, site n'aka onye nyocha Fransị Parfait-Louis Monteil, onye na-enyocha ókèala dị n'etiti mpaghara ọdịda anyanwụ nke ndi Afrịka kenyere ndị Fransị na ndị Briteni. [3] Onye agha Sudan Rabih az-Zubayr weghaara ma chụọ ya n'obodo ahụ n'afọ 1893 na ndị Britain n'afọ 1902.

N'akụkọ ihe mere eme, obodo ahụ buru ibu karịa ka ọ dị taa, site n' atụmatụ ọnụnụ ọgụgụruruhihe e dịka puku iri ise- puku iri isii nke ndị ị Briteni merụ na njedebe narị afọ nke iri na itoolu.

Obodo ndị dị n'okpuru ọchịchị Kukawa gụnyere Cross Kauwa na Baga, mana o nweghị ebe a na-akpọ Kukawa ma e wezụga ọchịchị ime obodo.

Ọ bụ otu n'ime ọchịchị ime Obodo iri na isii mebere Borno Emirate, steeti ọdịnala dị na Borno Steeti, Naijiria. [4]

Na mkpụrụ Ụbọchị iri na isii nke ọnwa Jenụwarị n'afọ 2015, "onyeisi oche onye nlekọta anya nke ọnọdu ọchịchị ime Obodo Kukawa, Musa Alhaji Bukar Kukawa", na-ekwuchitere ndị Kukawai a chụgara na Medụgiri na-nsochi ogbugbu Baga n'afọ 2015, "kpọkuru gọọmenti etiti ka ọ gbalisie ike na ọrụ ndị agha ka ha wee nwere ike ịlaghachi n'ụlọ ha." [5] Ogbugbu mere na Kukawa na Julaị n'afọ 2015.

Ndị Islamic State West Africa Province (ISWAP) jidere ọtụtụ narị ụmụ amaala Kukawa n' ọnwa Ọgọsụtụ n'afọ 2020 . Nde mmadụ abụọ nọ na Borno agbapụla n'ụlọ ha n'ime afọ iri gara aga ebe Ọtụtụ ndị bi n'ọnọdụ ọjọọ na Medụgiri . [6]

Edensibia dezie

  1. 1.0 1.1 Kemper (2012). Labyrinth of Kingdoms: 10,000 Miles Through Islamic Africa. New York: W. W. Norton, 137–152. ISBN 978-0-393-07966-1. 
  2. (1985) in J. D. Fage: The Cambridge History of Africa, Volume 6. Cambridge University Press. ISBN 9780521228039. Retrieved on June 3, 2014. 
  3. Emil Lengyel (March 2007). Dakar - Outpost of Two Hemispheres. READ BOOKS, 2007, 170ff. ISBN 978-1-4067-6146-7. Retrieved on 2010-10-11. 
  4. Nigeria (2000). Nigeria: a people united, a future assured, Millennium, Abuja, Nigeria: Federal Ministry of Information. ISBN 9780104089. 
  5. Hamza Idris and Yahaya Ibrahim. Nigeria: CBN, Nema Reach Out to Baga Attack Victims, Others. Daily Trust - allAfrica.com, January 16, 2015
  6. Nigerian army says 'in full control' of town where hostages taken. www.aljazeera.com. Retrieved on August 20, 2020.