Kọfị azụmahịa ziri ezi
Ezigbo kọfị bụ kọfị a kwadoro ka ọ bụrụ nke ụlọ ọrụ Azụmaahịa ziri ezi mepụtara na ụkpụrụ azụmahịa ziri ezi, nke n'emepụta mmekọrịta azụmaahịa nke dabeere na mkparịta ụka, nghọta na nkwanye ùgwù, na ebum n'uche nke inweta ikpe ziri ezi na Azụmaahịa mba ụwa. Njikọ ndị a n'enye aka na mmepe n'adịgide adịgide site n'inye ndị ọrụ ụgbọ kọfị ọnọdụ azụmaahịa ka mma. Òtù azụmahịa ziri ezi n'akwado ndị n'emepụta ihe na ọrụ ugbo n'adịgide adịgide ma machibido ọrụ ụmụaka ma ọ bụ ọrụ mmanye.
Akụkọ ihe mere eme
dezieTụpụ azụmahịa ziri ezi, International Coffee Organization n'achịkwa ọnụahịa dị ka iwụ nke International Coffee Agreement nke n'afọ 1962 si dị. Nkwekọrịta a, nke ndị otu Coffee Study Group kwurịtara na United Nations, setịpụrụ oke na ọnụ ọgụgụ kọfị a n'ere n'etiti mba ka ọ ghara inwe oke na ọnụahịa. ICA dị rụọ afọ ise wee mezigharịa ya n'afọ 1968.
A tụgharịrị nkwekọrịta ahụ n'afọ 1976 n'ihi ọnụ ahịa kọfị n'arịwanye elu, n'ụzọ dị ukwuu n'ihi oke oyi na mba Brazil. Nkwekọrịta ọhụrụ ahụ nyere ohere maka ịkwụsị ọnụahịa ma ọ bụrụ na nnyefe kọfị enweghị ike izute ihe achọrọ, ma mee ka ha nwee ike ma ọ bụrụgodị na ọnụahịa adaa nke ukwuu.
Mgbe e bidoro asambodo azụmahịa ziri ezi, e mechara malite akara "Transfair" na mba Germany, n'ime afọ iri, ụlọ ọrụ atọ ọzọ malitere: The Fairtrade Foundation, TransFair USA, na Rättvisemärkt. N'afọ 1997, òtù anọ a jikọrọ aka mepụta Fairtrade International (nke a na-akpọbu FLO, ma ọ bụ Fairtrade Labelling Organizations International), nke n'aga n'ihu n'esetịpụ ụkpụrụ Fairtrade, n'enyocha ma n'enye ndị ọrụ ụgbọ asambodo.[1]
Òtù azụmahịa ziri ezi
dezieÒtù ndị n'akpọ aha azụmahịa ziri ezi nwere ọtụtụ òkè ahịa na ndị n'ere site na nnukwu ụlọ ahịa n'ezo aka na nkọwa nke FINE mepụtara, njikọ nke netwọk azụmahịa ziri ezi nke mba ụwa anọ (Fairtrade Labelling Organizations International, World Fair Trade Organization (WFTO), Network of European World stores na European Fair Trade Association (EFTA)). Ụkpụrụ ndị Fairtrade Labelling Organization mepụtara bụ ndị a n'ejikarị eme ihe.[2] Fairtrade Labelling Organization (FLO) International bụ òtù zuru oke nke n'achịkwa usoro azụmahịa ziri ezi. Ebum n'uche ya bụ inweta ụkpụrụ dị elu n'ime usoro azụmahịa ziri ezi n'ihe gbasara ntụkwasị obi, ịgbaso ụkpụrụ Fairtrade site n'aka ndị n'emepụta, ndị n'ere ahịa, na ndị n'azụ ahịa.
- Ịtọlite Ụkpụrụ Azụmaahịa Ezigbo Mba Nile
- FLO n'enye ntọala ọkọlọtọ onwe ya, nke doro anya na nke ruru eru site n'ịtụ aro ụkpụrụ Fairtrade na FLO Board nke na-ekpebi ma a na-emezu ụkpụrụ.[3] Onye ọ bụla na-emepụta ma ọ bụ onye n'ere ahịa g'ezute ụkpụrụ ndị dị n'ozuzu na ụkpụrụ ngwaahịa nke n'eme ka ọnụahịa kacha nta nke a na-ewere dị ka ihe ziri ezi nye ndị na-emepụta ihe. Ha na-achọkwa mmekọrịta azụmaahịa ogologo oge na Nkwado gburugburu ebe obibi.
- Ime ka ọ dịrị mfe ma zụlite azụmahịa ziri ezi
- FLO na-arụkọ ọrụ na ụlọ ọrụ ndị n'emepụta Fairtrade Certified na ndị n'ere ahịa iji kwekọọ na nnyefe na ọchịchọ. Ọ bụkwa ọrụ ya iji mee ka òtù ndị a sie ike ma melite ohere ha nwere ịbanye n'ahịa.
- Ime ikpe maka ikpe ziri ezi
- FLO na ndị ọzọ n'ahụ maka azụmahịa ziri ezi, IFAT, NEWS na EFTA n'otu n'otu, mepụtara otu Platform a n'akpọ FINE (na-eguzo maka mkpụrụedemede mbụ nke FLO, IFAT، NEWS na AELT) iji rụkọọ ọrụ ọnụ iji kwalite ikpe ziri ezi maka azụmahịa na arụmụka gbasara azụmahịa na mmepe.[3] Rp 100,000,000.00
Atụmatụ asambodo na asọmpi
dezie- ↑ Max Havelaar Foundation. HOW DID IT ACTUALLY START? (nl, en). FairTrade Max Havelaar Netherlands. Max Havelaar Foundation. Archived from the original on 16 January 2013. Retrieved on 5 August 2012.
- ↑ Trade Standard. Fairtrade Labelling Organizations International. Archived from the original on 2 September 2014. Retrieved on 6 September 2014.
- ↑ 3.0 3.1 Fairtrade International (FLO): Fairtrade International. www.fairtrade.net. Retrieved on 2019-04-17.