Igbo Landing
historic site
mba/obodoNjikota Obodo Amerika Dezie
dị na ngalaba nhazi mpagharaSaint Simons Island Dezie
nhazi ọnọdụ31°11′14″N 81°23′14″W Dezie
Map

Igbo Landing (Nwutù ndi Ìgbò ǹke ha nà è dezikwa kà Ibo Landing, Ebo Landing, mà ọ̀ bụ̀ Ebos Landing) bụ ebe ị̀ta nà okwu dị nà òkòlò Dunbar nà àgwà St. Simon, ọnụmara Glynn, Giọjia nà Njikọ̀taọ̀hà. Ọ bụ̀ ebe oke nkwụrụụ̀dọ̀ ndị Ìgbò ha gbàrà ohù kwụ̀rụ̀ nà afọ̀ 1803, ǹke okwu ya bụ̀ nà ndị Ìgbò â ha gbàrà ohù nazọ̀rọ̀ okeụgbọ ohù ǹke buru ha ga àlà Njikọ̀taọ̀hà. Akụkọ â sị̀ nà ndị â lubàrà ònwe ha nà òkòlò nà ihì ịkwụụ̀dọ̀ màkà ha sị̀ kamà ha gà èresi ha kà ohù, òtù ndị Njikọ̀taọ̀hà, ǹke nọ na a bụzịrị ndi bèkeè, nà ème ndị isi ojiì ǹke si Eluàlà, ha gà à nwụtọ nà mmiri, ha sị ha g'ị jewezi ijè nà mmụọ, jefè èhère mmiri, lọàchitazi ụlọ̀ ha. Ndi Ìgbò â nụpụ̀rụ̀ isi, jụ nà ndị butere ha g'ịgbara ha ohù nke ha gị bụ̀ ọnụ rụ ọrụ nà àbọ. Ịhẹ òmùme â bàrà urù kà akụkọ pụzịrị kà mmara àtụ̀ ọma ǹke ndị ndị Eluàlà-Àlàn'àba jị̀kwà à kọta akụkọ ifo mà ị de ị̀tà ndere ǹke dị ha mkpà.

Ùde àlà nà àgwà St. Simon.

Ị̀ta dezie

Nà ọnwaìse afọ̀ 1803, ndị nkère ǹkè nchị Njikọ̀taọ̀hà gbàzìrì ego tụdàrà ndi Eluàlà ǹkè ha nànwụ̀rụ̀, juru ụgbọ ohù, ǹkè ndị sala okenlapụ̀, nà Savannah nà ihì ị mare ha nà ahia ohù ǹkè ama ǹso. Soro nà ndịǹfega ụgbọ ahụ̀ bụ̀ ọ̀tụtụ ndị ìgbò h'e jìdèrè, ǹkè mbà sị ịhe bụrụ Naijiria taà. Ndị n'e so àbọ nà ndị n'a gbaraohù mà ndị Ìgbò kà ndị njideònwesi ike na ndị jụpụ̀rụ̀ mgbaraohù njionye na ike. Ndị Ìgbò â zuru 75 bụ̀ ndị ọ̀gwarame ǹke John Couper nà Thomas Spalding kwụ̀rụ̀ $100 nà isi ha otù otù ịzụ ha màkà ị rụ nà mmara aka ike nà àbọ ha dị na àgwà St. Simon.