Ọrịa mamịrị A

Ọrịa mamịrị A
ọrịa ọrịa, notifiable disease, class of disease
obere ụdị nkeviral infectious disease, viral hepatitis, Ọrịa a na-ebute na mmiri, disease Dezie
ihe kpatara yaHepatitis A virus Dezie
afflictsliver Dezie
health specialtyinfectious diseases Dezie
nyocha ahụikeELISEA, polymerase chain reaction Dezie
Ọgwụgwọ enwere ikedetoxification, Q4532072 Dezie
usoro nnyefe ọrịafecal–oral route Dezie
NCI Thesaurus IDC3096 Dezie

Ọrịa mamịrị A (akpọburu ọrịa mamịrị na efe efe) bụ ọrịa na efe efe gara aga nke umeju nke nje ọrịa mamịrị A na ebute (HAV).[1] Ọtụtụ nsogbu nwere obere ma ọ bụ ihe mgbanwe na adịghị ncha ncha n’ebe ndị etolite nọ.[2] Oge dị n’etiti ibute ọrịa a yana ihe mgbanwe, n’ime ndị na ebuwanye, bụ n’etiti izu abụọ na isii.[3] Mgbe enwere ihe mgbanwe ha na anọkarị izu asatọ, ha nwere ike ịgụnye: ajụ, ịgbọ agbọọ, afọ ọsịsa, ọchananya|anụahụ edo-edo, ịba, afọ mgbu.[2] N’ime 10-15% nke ndị mmadụ na enwe nlaghachite nke ihe mgbanwe n’oge ọnwa isii ka enwechara mbute ọrịa ahụ izizi.[2] Mbibi umeju dị gara gara nwere ike ime oge ụfọdụ, a na ahụkarị nke a n’ebe ndị okenye nọ.[2]

Ọrịa mamịrị A
Nhazi na ihe ndị enwetara n’ime
Okwu banyere jaundice kpatara site na ịba ọcha n'anya A
ICD-10B15
ICD-9070.0, 070.1
DiseasesDB5757
MedlinePlus000278
MeSHD006506
Ọrịa mamịrị A (Hepatitis A): Life cycle.
Ọrịa mamịrị A (Hepatitis A) na Ala.

A na ekesakarị ya site na iri nri ma ọ bụ ịṅụ nri ma ọ bụ mmiri nwere nsị bu ọrịa.[2] Azụ okpokoro nke esibeghị nke ọma bụkwa ebe ọzọ ama ama esi ebute ya.[4] Enwekwara ike ịkesa ya site na ịmetụta onye bụ ọrịa ahụ.[2] Ebe ụmụaka anakarị enwe ihe mgbanwe mgbe ha butere ọrịa ahụ ha ka nwere ike ibunye ndị ọzọ ọrịa ahụ.[2] Ka ebutechara ọrịa otu oge, onye ahụ agaghịzị enweta ọrịa ahụ ọzọ na ndụ ya niile.[5] Ịchọpụta nsogbu chọrọ inyocha ọbara dị ka ihe mgbanwe ndị ahụ yitere ọnụọgụ nke ọrịa ndị ọzọ.[2] Ọ bụ otu n’ime ise ama ọrịa mamịrị nje: A, B, C, D, yana E.

Ọgwụ mgbochi ọrịa mamịrị dị mma maka mgbochi.[2][6] Ụfọdụ obodo na akwado ya maka ụmụaka yana maka ndị nwere nnukwu ohere ibute ya ndị na agbabeghị ọgwụ mgbochi.[2][7] O gosiri na ọ dị mma maka ndụ.[2] Ụkpụrụ mgbochi ndị ọzọ gụnyere ịsacha aka yana isi nri nke ọma.[2] Enweghị ọgwụgwọ ọ bụla ama ama, iji ezumike na ịṅụ ọgwụ maka ajụ ma ọ bụ afọ ọsịsa akwadoro dị ka otu esi chọọ ya.[2] Mbute ọrịa na ala kpamkpam na enweghị ọrịa umeju na aga aga.[2] Ọgwụgwọ nke mbibi umeju dị gara gara, ọ bụrụ na ọ dapụta, bụ mbufe umeju.[2]

Na gburugburu ụwa okwu ihe mgbanwe nde 1.5 na eme kwa afọ[2] na abụkarị imirikiti nde nke mbute ọrịa na nchịkọta.[8] Ọ na adịkarị na mpaghara nke ụwa nwere gburugburu jọrọ njọ, na enweghị mmiri dị mma zuru oke.[7] Na ụwa na etolite etolite ihe dị ka 90% nke ụmụaka ebutela ọrịa n’ebe afọ 10, ebe ọ dị otu ahụ ha enweela mgbochi na okenye.[7] Ọ na emekarị na mberede n’obodo ndị tolitere nke ọma ebe anaghị ekpughepu ụmụaka mgbe ha dị ntakịrị, ma enweghị ịnye ọgwụ mgbochi n’ala niile.[7] Na 2010, ọrịa mamịrị dị gara gara dapụtara na ọnwụ 102,000.[9] Ụbọchị Ọrịa Mamịrị N’ụwa na eme kwa afọ na Julaị 28 iji mee ka amara ọrịa mamịrị nje na ebute.[7]

Lee nke ozo dezie

Nrụtụ aka dezie

  1. Ryan KJ, Ray CG (editors) (2004). Sherris Medical Microbiology, 4th, McGraw Hill, 541–4. ISBN 0-8385-8529-9. 
  2. 2.00 2.01 2.02 2.03 2.04 2.05 2.06 2.07 2.08 2.09 2.10 2.11 2.12 2.13 2.14 2.15 Matheny, SC (1 December 2012). "Hepatitis A.". Am Fam Physician 86 (11): 1027–34; quiz 1010–2. PMID 23198670. 
  3. Connor BA (2005). "Hepatitis A vaccine in the last-minute traveler". Am. J. Med. 118 (Suppl 10A): 58S–62S. DOI:10.1016/j.amjmed.2005.07.018. PMID 16271543. 
  4. (March 2013) "Shellfish-borne viral outbreaks: a systematic review.". Food Environ Virol 5 (1): 13–23. DOI:10.1007/s12560-012-9097-6. PMID 23412719. 
  5. (2006) The Encyclopedia of Hepatitis and Other Liver Diseases. Infobase. ISBN 9780816069903. 
  6. (2012) "Hepatitis A immunisation in persons not previously exposed to hepatitis A.". Cochrane Database Syst Rev 7: CD009051. DOI:10.1002/14651858.CD009051.pub2. PMID 22786522. 
  7. 7.0 7.1 7.2 7.3 7.4 Hepatitis A Fact sheet N°328. World Health Organization (July 2013). Retrieved on 20 February 2014.
  8. Wasley, A (2006). "Hepatitis A in the era of vaccination.". Epidemiol Rev 28: 101–11. DOI:10.1093/epirev/mxj012. PMID 16775039. 
  9. Lozano, R (Dec 15, 2012). "Global and regional mortality from 235 causes of death for 20 age groups in 1990 and 2010: a systematic analysis for the Global Burden of Disease Study 2010". Lancet 380 (9859): 2095–128. DOI:10.1016/S0140-6736(12)61728-0. PMID 23245604.