Ọgụ̀ ǹkè Albuera

Ọgụ̀ ǹkè Albuera
battle
Akụkụ nkePeninsular War Dezie
mba/obodoSpain Dezie
ebeLa Albuera Dezie
nhazi ọnọdụ38°43′0″N 6°49′0″W Dezie
oge omelu16 Mee 1811 Dezie
sonyereFirst French Empire, United Kingdom of Great Britain and Ireland Dezie
Map

Ọgụ̀ ǹkè Albuera (16 ọnwaìse 1811) bụ̀rụ̀ ọgụ̀ mere m̀gbè agha ọ̀kàrààgwà. Ụ̀sụ̀agha gwakọtara ndị Britain nà Spain mà ndị Portugual lụsụ̀rụ̀ ndị òtù France ǹke Armée du Midi (òtùagha ǹke nledà) nà ogbè ntàkịrị ǹkè ndị Spain ha kpọ̀ Albuera, ebe rutụrụ km 20 (mi 12) si nà nledà ebe ọgwaìga ebe ndị nlụ̀sụduru dị nà Badajoz ime Spain.

Marshal Beresford n'èwefù okpì onye ndụsụ Poland nà ọgụ̀ ǹkè Albuera. M̀bì sì aka T. Sutherland, afọ̀ 1831.
Akààlà ọgụ̀ â, si Napier's History of the War in the Peninsula

Site nà ọnwaìri 1810 ụ̀sụ̀agha diọ̀gbọagha Masséna ǹke Portugal lụsụ̀rụ̀ ọgụ̀ ǹke biri ha nà ụsụkọtaraagha Wellington, nọ nà m̀gbòdò nà àzụ ahịrị ǹkè Torres Vedras. N'è me nà ndiri Napoleon, nà afọ̀ 1811 gboo Marshal Soult èduru òtù nnwasàa ǹkè France si Andalusia gbabà Extremadura nà ihì ị dufù ike ndị nlụ̀kọ si ahịrị kò o me fèwe ahụhụ Masséna. Ǹzù Napoleon à kaala nà nzọrọ Soult a bian'ogè ǹlaàzụ; nọrọ nà agụọ nà ike ngụrụ, ụ̀sụ̀agha Masséna èmeelarị̀ ị kwelaàzụ ị lọhuo Spain. Soult mètàrà ị jìde ọgwaìga nà Badajoz ǹke dị mkpà nà nhàzi agha nà ìkpere wabàrà n'ètitì Spain nà Portugal si nà aka ndị Spain, mànà ọ hị̀rị̀ ya ị laàchita Andalusia nà ogè soro mmedà Marshal Victor nà ọnwaàtọ nà ọgụ̀ ǹkè Barrosa. Màkwà, Soult hàrà Badajoz nà m̀gbòdò ike. Nà ọnwaànọ, si nà ịhe soro ọ̀rị̀rị̀ ǹke bụ nà Masséna à kwelaàchicha àzụ si nà Portugal, Wellington e zìri ike àdị̀ịlụ Portugal-England ǹke Sir William Beresford n'èdiri kà ha ga nàkwawaria ama n'ìkpere ahụ̀. Ndị nlụ̀kọ chụgbàrà okeòkè ndị ijèagha France si nà mpaghara ebe ahụ̀ ha è mezi bido mgbasụ̀ọgụ̀ ǹkè Badajoz.

Soult è me ngwaǹgwà ị chìkọta ụ̀sụ̀ ọhụrụ si nà ike ụ̀sụ̀ ndị France nà Andalusia nà, o sò ndị ụkwụụ̀sụ̀ na à laàzụ n'ihu Beresford, ọ gbazọ̀rọ̀ ị zọ̀ ọgụ̀ nà mgbasụọgụ̀. Ji ǹzù ǹkè ndịùsuagha na à bia—ụ̀sụ̀ Spain nọ nà ndiri Gen. Joaquín Blake—o zùrù ị tụwaria ǹkụ̀agha Beresford nà ị wabà ụsụ ya nà ètitì ha. Mànà, Soult è me ọ̀zọ ị zùru nè ị mewe ịhẹ si nà ìzù ǹke kàala; nà ǹke Marshal amaghị̀, ndị Spain è meelarị̀ ị yịkọta ha nà àdị̀ịlụ England-Portugal, nà ụkwụụ̀sụ̀ ya ǹke zuru madụ̀ 24,000 nọ̀zì na è le ị lụgara ụ̀sụ̀ ndị nlụ̀kọ zuru ụkwụụ̀sụ̀ 35,000.

Ụ̀sụ̀ nlụsụ è tie nà ogbè Albuera. Ndị nlụsụ mà àbụọ dàgbùrù ị nwe ndị ǹlàa nà oke aghara soro nị nà ndị France e mecha kwelaàzụ nà 18 ọnwaìse. Ụ̀sụ̀ Beresford a kàgbuole nà è jighị̀ ike ị chụrụ, mànà ha è meze gbaziri òmùme nà Badajoz. Mà ọ bụ̀ nà Soult dàrà ị chara ama ahụ̀, mànà ọgụ̀ enweghị ịhe haziri hìe agha ọ nọ̀ n'ime. Otù mkpụrụ ọnwa gafèrè, nà ọnwaìsiì 1811, o jìrì ndị nlụ̀kọ ị hatọ mgbasụọgụ̀ si nà ụzọ̀ ndị ụ̀sụ̀ France nà Portugal mà Andalusia ǹke biakọtaria.