Ijipùtù Ọkpụ: Ọdịiche dị n'etiti nyochagharị

Content deleted Content added
Ukabia (ṅkátá | mmetara)
Jiri ''''Ijipùtù Ochie''' bụ̀ òbìbiị̀hè ǹkè Òlìleanyanwụ̄ Afụ̀rịkà, ǹkè nọkwùsàrà ụkwụ Ànyị̀m̀ Naị̀lụ̀, nọdokwa nà ime ebe bụ òbòd...' kere ihü
O nweghị ihe dị iche.

Orübà nà ógè 13:01, 16 Febụwarị 2020

Ijipùtù Ochie bụ̀ òbìbiị̀hè ǹkè Òlìleanyanwụ̄ Afụ̀rịkà, ǹkè nọkwùsàrà ụkwụ Ànyị̀m̀ Naị̀lụ̀, nọdokwa nà ime ebe bụ òbòdò Ijipùtù ụ̀gbụ̀ â. Òbìbiị̀hè Ijipùtù Ochie sò Ijipùtù m̀buụ̀zọ̀ị̀ta nà àzụ bị̀a, ya à yịakọta nà ogè gbara afọ̀ AO (afọ̀ ochie) 3100 gburù (nà òtù o sì dị nà ndoziogè Ijipùtù nà ǹkịtị̀), m̀gbè ọ̀chịchị yị̀kọ̀tàrà Ijipùtù Elu nà Àlà nà òkpurù ọchịchị Menezụ (a dị̀kwa à ma kà Namà). Ị̀ta Ijipùtù gàrà kà usòrò òbòdòezè dozimara è dozi, ǹkè ùkè wara ha na ọ̀tụtụ èhì ǹkè ha mà kà Èhì Àdịnàètitì bụzị: Òbòdòezè Nka ǹkè Èhì Òze Gboo, Òbòdòezè Ètitì ǹkè Èhì Òze ÈtitìÒbòdòezè Ọhụrụ ǹkè Èhì Òze Ìkpeàzụ.

Ijipùtù rùrù isi ike ya nà Òbòdòezè Ọhụrụ m̀gbè ọ chị̀chàrà oke ibe àlà Nubiyà nà òkè ukwu àlà Ọ̀wụ̀waanyanwụ̄ Ǹso, ya e sozị nà o jì nwanyọ̀ ba èhì ndara ike ya. Nà ọdịdị ya Ijipùtù dàrà nà òkpurù mbìchi ǹkè ọ̀tụtụ ndị ọbị̀à merịrị ha, bụkwa ndị Hikusoòsù, ndị Libiyà, ndị Nubiyà, ndị Àsịriyà, ndị Pezhìà Àkimīnìdì, nà ndị Màsèdoniyà nà òkpurù Àlèzandà Ọ̀kààkâ. Ndị Gùriìkì Òbòdòezè Tọ̀lèmeè rụ̀kọtàrà nà mmecha ọnwụ Àlèzandà Ọ̀kààkâ dùrù Ijipùtù ruo afọ̀ AO 30 m̀gbè, nà òkpurù Kùlìyòpatụrà, ọ dàrà nà aka ndị Àgbàtàike Roòmụ̀, bụzịe ibeòbòdò Roòmụ̀.