Malcolm X: Ọdịiche dị n'etiti nyochagharị

Content deleted Content added
Ukabia (ṅkátá | mmetara)
No edit summary
Ukabia (ṅkátá | mmetara)
No edit summary
Ahiri 18:
|footnotes =
}}
'''Malcolm X''' (o sì nà nwatà zàa ahà '''Malcolm Little'''; 19 Ọnwaìse 1925 — 21 Ọnwaàbụọ 1965) ha màkwà ya kà '''El-Hajj Malik El-Shabazz''' (nà asụ̀sụ̀ Arabic: الحاجّ مالك الشباز‎) bụ̀ m̀gbè m̀bụ onye [[Ndị Afụrịka ǹkè Amerịka|Afụrịka ǹkè Amerịka]] onye [[Áláküba|Àlakụ̀ba]] ǹkè onye isi, onye nkwsinkwusi okwu, nà onye ndozi ìwu madụ̀. Nà anya ndị n'e so ya, ọ bụ̀ onye ike nà òdogwu màkà ịhe ọma o mèrè ndị Afrika ǹkè Amerika màkà ìwundụ̀ ha. Ọ bụ̀kwà màkà o chèdòrò ndị Afrika ime okwu o kwùrù màkà ndị ọcha ndị n'e megbu ndị oji. Ndị ọ̀ naghị̀ à masịrị ha sị̀ ọ̀ bụ̀ onye n'e kwudà ndị ọcha, ha à sịkwa nà o n'e wèli ndị oji na elu isi ndị ọcha, ọ n'e kwudà [[ndị Ju]], nà ọ bụ̀ onye ọ̀chọ ọ̀gụ̀. Madụ̀ sị̀ nà ọ bụ̀ onye Afrika ǹkè Amerika kachasị ị nwere ịhe ukwu o mèrè nà ụ̀wà.
 
Ha mụ̀rụ̀ Malcolm X nà [[Omaha, Nebraska]]. Ịhe mere nà m̀gbè o n'è to, dị kà nkwuzi nnà ya zìrì ya màkà [[ńwèliùgwù ndị oji]] nà ị rụ nà aka ònwe gị, nà ịhe ọ hụ̀rụ̀ nà anya ya gbasara ịhe ndị oji n'à tara ahụhụ ndị ọcha, bụ̀ ịhe mkpà nà ndụ̀ Malcolm X m̀gbè o n'è to. M̀gbè o tozùrù afọ̀ ìri nà àtọ, nnà ya nwụ̀rụ̀ nà nne ya gàrà ụlọ̀ ọgwụ̀ isi. M̀gbè ọ bàchàrà ụlọ̀ ndị ọ̀zọ n'e lekọta ya, Malcolm X bànyèrè ọrụ ahia àzụ nà ịhe dara ìwu nà [[Boston]] nà [[New York City]] kwa. Nà afọ̀ 1946, ụlọ̀ ìkpe tọ̀rọ̀ Malcolm X mkpọrọ zuru afọ̀ àsatọ mà ọ̀ bụ̀ ìri.